< Ọpụpụ 12 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha,
The Lord told Moses and Aaron while they were still in Egypt,
2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.
“This month will be for you the first month, the first month of your year.
3 Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla.
Tell all the Israelites that on the tenth day of this month, every man must choose a lamb for his family, one for each household.
4 Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ.
However, if the household is too small for a whole lamb, then he and his nearest neighbor may choose a lamb according to the total number of people. Divide up the lamb depending on what everybody can eat.
5 Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
Your lamb must be a year-old male without any defects, and you can take it either from the sheep or the goats.
6 Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
Keep it until the fourteenth day of the month, when all the Israelites will slaughter the animals after sunset and before it gets dark.
7 Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.
They are to take some of the blood and put it on the sides and tops of the doorframes of the houses where they have the meal.
8 Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
They are to roast the meat over a fire and eat it that night, together with unleavened bread and bitter herbs.
9 A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.
You are not to eat the meat raw or boiled in water. All of it must be roasted it over a fire, including the head, legs, and its insides.
10 Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.
Make sure nothing is left until the morning. If there is anything left over, burn it by morning.
11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
This is how you are to eat the meal. You should be dressed ready to travel, with your sandals on your feet and your walking stick in your hand. You are to eat quickly—it is the Lord's Passover.
12 “Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.
That very night I will go all through Egypt and kill every firstborn of both people and animals, and I will bring condemnation on all the gods of Egypt. I am the Lord.
13 Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.
The blood on the houses where you live will mark them out. When I see the blood, I will pass over you. No deathly plague will fall on you to destroy you when I attack Egypt.
14 “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
This will be a day to remember for you. You are to celebrate it as a festival to the Lord for generations to come. You will observe this for all time to come.
15 Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel.
For seven days you must eat only bread made without yeast. On the first day you are to get rid of the yeast from your houses. Anyone who eats anything with yeast from the first day to seventh day must be excluded from the Israelite community.
16 Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri.
On both the first day and on the seventh day you are to have a holy meeting. You must not work on those days, except to prepare food. That is all you are allowed to do.
17 “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ
You are to keep the Feast of Unleavened Bread because on this very day I led your tribes by their respective divisions out of Egypt. You are to observe this day for all time to come.
18 Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu.
In the first month you are to eat bread without yeast from the evening of the fourteenth day until the evening of the twenty-first day.
19 Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala.
For seven days there must be no yeast in your houses. If anyone eats something with yeast in it, then they must be excluded from the Israelite community, whether they are a foreigner or native of the land.
20 Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.”
You must not eat anything with yeast in it. Eat only bread without yeast in all your homes.”
21 Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a.
Then Moses called together all the elders of Israel and told them, “Go immediately and choose a lamb for each of your families, and kill the Passover lamb.
22 Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.
Get a bunch of hyssop, dip it into the blood in the basin, and put some on the top and sides of the doorframe. None of you are to go out through door of the house until morning.
23 Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.
When the Lord passes through to punish the Egyptians, he will see the blood on the top and sides of the doorframe. He will pass over the door, and he will not allow the destroyer to enter your houses and kill you.
24 “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
You and your descendants are to remember to observe these instructions for all time to come.
25 Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a.
When you enter the land that the Lord promised to give you, you are to observe this ceremony.
26 Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’
When your children come and ask you, ‘Why is this ceremony important to you?’
27 Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’”
you are to tell them, ‘This is the Passover sacrifice to the Lord. He was the one who passed over the houses of the Israelites in Egypt when he killed the Egyptians but spared our households.’” The people bowed down in worship.
28 Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn.
Then the Israelites went and did just as the Lord had told Moses and Aaron.
29 Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.
At midnight the Lord killed every firstborn male in the land of Egypt, from the firstborn of Pharaoh, who sat on his throne, to the firstborn of the prisoner in the jail, and also all the firstborn of the livestock.
30 Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị.
Pharaoh got up during the night, as well as all his officials and all the Egyptians. There were loud cries of agony throughout Egypt, because there wasn't a single house where someone hadn't died.
31 Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.
Pharaoh called for Moses and Aaron during the night and told them, “Get out of here! Leave my people, the two of you and the Israelites! Go, so you can worship the Lord as you have asked.
32 Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.”
Take your flocks and herds as well, just like you've said, and leave! Oh, and bless me too.”
33 Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”
The Egyptians urged the Israelites to leave their country as quickly as possible, saying, “Otherwise we'll all die!”
34 Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
So the Israelites picked up their dough before it had risen, and carried it on their shoulders in kneading bowls wrapped in clothing.
35 Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe.
In addition, the Israelites did what Moses had told them and asked the Egyptians for objects of silver and gold, and for clothing.
36 Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ.
The Lord had made the Egyptians look so favorably on the Israelites that they agreed their request. In this way they took the wealth of the Egyptians.
37 Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị.
The Israelites set out on foot from Rameses for Succoth and numbered about 600,000 men, as well as women and children.
38 Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ.
In addition many foreigners joined them. They also took with them large herds and flocks of livestock.
39 Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
Since their bread dough didn't have any yeast, the Israelites baked what they had brought out of Egypt into loaves without yeast. This was because when they were driven out of Egypt they had to leave in a hurry and didn't have time to prepare food for themselves.
40 Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.
The Israelites had lived in Egypt for 430 years.
41 Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.
On the very day the 430 years ended, all the tribes of the Lord by their respective divisions left Egypt.
42 Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
Because the Lord kept watch that night to lead them out of the land of Egypt, you are to keep watch this same night as an observance to honor the Lord, to be kept by all Israelites for generations to come.
43 Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.
The Lord told Moses and Aaron, “This is the Passover ceremony. No foreigner is allowed to eat it.
44 Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu.
But any slave who has been bought can eat it once you have circumcised him.
45 Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya.
Foreign visitors or those hired from other nations shall not eat the Passover.
46 “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ.
It has to be eaten inside the house. You are not allowed to take any of the meat outside the house, or to break any of the bones.
47 Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a.
All Israelites are to celebrate it.
48 “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ.
If there's a foreigner lives with you and wants to celebrate the Lord's Passover, all the males in their household have to be circumcised. Then he may come and celebrate it, and he shall be treated like a native of the land. But no man who is not circumcised may eat it.
49 Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”
The same rule applies to both the native and the foreigner who lives among you.”
50 Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn.
Then all the Israelites followed these instructions. They did exactly what the Lord had commanded Moses and Aaron.
51 Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.
That very day the Lord led the Israelite tribes out of Egypt by their respective tribal divisions.

< Ọpụpụ 12 >