< Diuteronomi 7 >

1 Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;
When the Lord your God takes you into the land where you are going, which is to be your heritage, and has sent out the nations before you, the Hittites and the Girgashites and the Amorites and the Canaanites and the Perizzites and the Hivites and the Jebusites, seven nations greater and stronger than you;
2 mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.
And when the Lord has given them up into your hands and you have overcome them, give them up to complete destruction: make no agreement with them, and have no mercy on them:
3 Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.
Do not take wives or husbands from among them; do not give your daughters to their sons, or take their daughters for your sons.
4 Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.
For through them your sons will be turned from me to the worship of other gods: and the Lord will be moved to wrath against you and send destruction on you quickly.
5 Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.
But this is what you are to do to them: their altars are to be pulled down and their pillars broken, and their holy trees cut down and their images burned with fire.
6 Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
For you are a holy people to the Lord your God: marked out by the Lord your God to be his special people out of all the nations on the face of the earth.
7 Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.
The Lord did not give you his love or take you for himself because you were more in number than any other people; for you were the smallest of the nations:
8 Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.
But because of his love for you, and in order to keep his oath to your fathers, the Lord took you out with the strength of his hand, making you free from the prison-house and from the hand of Pharaoh, king of Egypt.
9 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
Be certain, then, that the Lord your God is God; whose faith and mercy are unchanging, who keeps his word through a thousand generations to those who have love for him and keep his laws;
10 Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.
Rewarding his haters to their face with destruction; he will have no mercy on his hater, but will give him open punishment.
11 Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa.
So keep the orders and the laws and the decisions which I give you today and do them.
12 Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.
And it will be, that if you give attention to these decisions and keep and do them, then the Lord will keep his agreement with you and his mercy, as he said in his oath to your fathers.
13 Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.
And he will give you his love, blessing you and increasing you: he will send his blessing on the offspring of your body and the fruit of your land, your grain and your wine and your oil, the increase of your cattle and the young of your flock, in the land which by his oath to your fathers he undertook to give you.
14 A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
You will have greater blessings than any other people: no male or female among you or among your cattle will be without offspring.
15 Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!
And the Lord will take away from you all disease, and will not put on you any of the evil diseases of Egypt which you have seen, but will put them on your haters.
16 Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.
And you are to send destruction on all the peoples which the Lord your God gives into your hands; have no pity on them, and do not give worship to their gods; for that will be a cause of sin to you.
17 Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?”
If you say in your hearts, These nations are greater in number than we are: how are we to take their land from them?
18 Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.
Have no fear of them, but keep well in mind what the Lord your God did to Pharaoh and to all Egypt;
19 Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.
The great punishments which your eyes saw, and the signs and the wonders and the strong hand and the stretched-out arm, by which the Lord your God took you out: so will the Lord your God do to all the peoples who are the cause of your fears.
20 Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.
And the Lord will send a hornet among them, till all the rest who have kept themselves safe from you in secret places have been cut off.
21 Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.
Have no fear of them: for the Lord your God is with you, a great God greatly to be feared.
22 Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.
The Lord your God will send out the nations before you little by little; they are not to be rooted out quickly, for fear that the beasts of the field may be increased overmuch against you.
23 Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.
But the Lord your God will give them up into your hands, overpowering them till their destruction is complete.
24 Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.
He will give their kings into your hands, and you will put their names out of existence under heaven; there is not one of them who will not give way before you, till their destruction is complete.
25 Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
The images of their gods are to be burned with fire: have no desire for the gold and silver on them, and do not take it for yourselves, for it will be a danger to you: it is a thing disgusting to the Lord your God:
26 Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.
And you may not take a disgusting thing into your house, and so become cursed with its curse: but keep yourselves from it, turning from it with fear and hate, for it is a cursed thing.

< Diuteronomi 7 >