< Diuteronomi 25 >

1 Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.
כִּֽי־יִהְיֶ֥ה רִיב֙ בֵּ֣ין אֲנָשִׁ֔ים וְנִגְּשׁ֥וּ אֶל־הַמִּשְׁפָּ֖ט וּשְׁפָט֑וּם וְהִצְדִּ֙יקוּ֙ אֶת־הַצַּדִּ֔יק וְהִרְשִׁ֖יעוּ אֶת־הָרָשָֽׁע׃
2 Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya,
וְהָיָ֛ה אִם־בִּ֥ן הַכֹּ֖ות הָרָשָׁ֑ע וְהִפִּילֹ֤ו הַשֹּׁפֵט֙ וְהִכָּ֣הוּ לְפָנָ֔יו כְּדֵ֥י רִשְׁעָתֹ֖ו בְּמִסְפָּֽר׃
3 ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.
אַרְבָּעִ֥ים יַכֶּ֖נּוּ לֹ֣א יֹסִ֑יף פֶּן־יֹסִ֨יף לְהַכֹּתֹ֤ו עַל־אֵ֙לֶּה֙ מַכָּ֣ה רַבָּ֔ה וְנִקְלָ֥ה אָחִ֖יךָ לְעֵינֶֽיךָ׃ ס
4 Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.
לֹא־תַחְסֹ֥ם שֹׁ֖ור בְּדִישֹֽׁו׃ ס
5 Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa.
כִּֽי־יֵשְׁב֨וּ אַחִ֜ים יַחְדָּ֗ו וּמֵ֨ת אַחַ֤ד מֵהֶם֙ וּבֵ֣ן אֵֽין־לֹ֔ו לֹֽא־תִהְיֶ֧ה אֵֽשֶׁת־הַמֵּ֛ת הַח֖וּצָה לְאִ֣ישׁ זָ֑ר יְבָמָהּ֙ יָבֹ֣א עָלֶ֔יהָ וּלְקָחָ֥הּ לֹ֛ו לְאִשָּׁ֖ה וְיִבְּמָֽהּ׃
6 Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.
וְהָיָ֗ה הַבְּכֹור֙ אֲשֶׁ֣ר תֵּלֵ֔ד יָק֕וּם עַל־שֵׁ֥ם אָחִ֖יו הַמֵּ֑ת וְלֹֽא־יִמָּחֶ֥ה שְׁמֹ֖ו מִיִּשְׂרָאֵֽל׃
7 Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.”
וְאִם־לֹ֤א יַחְפֹּץ֙ הָאִ֔ישׁ לָקַ֖חַת אֶת־יְבִמְתֹּ֑ו וְעָלְתָה֩ יְבִמְתֹּ֨ו הַשַּׁ֜עְרָה אֶל־הַזְּקֵנִ֗ים וְאָֽמְרָה֙ מֵאֵ֨ין יְבָמִ֜י לְהָקִ֨ים לְאָחִ֥יו שֵׁם֙ בְּיִשְׂרָאֵ֔ל לֹ֥א אָבָ֖ה יַבְּמִֽי׃
8 Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,”
וְקָֽרְאוּ־לֹ֥ו זִקְנֵי־עִירֹ֖ו וְדִבְּר֣וּ אֵלָ֑יו וְעָמַ֣ד וְאָמַ֔ר לֹ֥א חָפַ֖צְתִּי לְקַחְתָּֽהּ׃
9 nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.”
וְנִגְּשָׁ֨ה יְבִמְתֹּ֣ו אֵלָיו֮ לְעֵינֵ֣י הַזְּקֵנִים֒ וְחָלְצָ֤ה נַעֲלֹו֙ מֵעַ֣ל רַגְלֹ֔ו וְיָרְקָ֖ה בְּפָנָ֑יו וְעָֽנְתָה֙ וְאָ֣מְרָ֔ה כָּ֚כָה יֵעָשֶׂ֣ה לָאִ֔ישׁ אֲשֶׁ֥ר לֹא־יִבְנֶ֖ה אֶת־בֵּ֥ית אָחִֽיו׃
10 A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”
וְנִקְרָ֥א שְׁמֹ֖ו בְּיִשְׂרָאֵ֑ל בֵּ֖ית חֲל֥וּץ הַנָּֽעַל׃ ס
11 Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya,
כִּֽי־יִנָּצ֨וּ אֲנָשִׁ֤ים יַחְדָּו֙ אִ֣ישׁ וְאָחִ֔יו וְקֽ͏ָרְבָה֙ אֵ֣שֶׁת הָֽאֶחָ֔ד לְהַצִּ֥יל אֶת־אִישָּׁ֖הּ מִיַּ֣ד מַכֵּ֑הוּ וְשָׁלְחָ֣ה יָדָ֔הּ וְהֶחֱזִ֖יקָה בִּמְבֻשָֽׁיו׃
12 a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya.
וְקַצֹּתָ֖ה אֶת־כַּפָּ֑הּ לֹ֥א תָחֹ֖וס עֵינֶֽךָ׃ ס
13 Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.
לֹֽא־יִהְיֶ֥ה לְךָ֛ בְּכִֽיסְךָ֖ אֶ֣בֶן וָאָ֑בֶן גְּדֹולָ֖ה וּקְטַנָּֽה׃ ס
14 Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta.
לֹא־יִהְיֶ֥ה לְךָ֛ בְּבֵיתְךָ֖ אֵיפָ֣ה וְאֵיפָ֑ה גְּדֹולָ֖ה וּקְטַנָּֽה׃
15 Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
אֶ֣בֶן שְׁלֵמָ֤ה וָצֶ֙דֶק֙ יִֽהְיֶה־לָּ֔ךְ אֵיפָ֧ה שְׁלֵמָ֛ה וָצֶ֖דֶק יִֽהְיֶה־לָּ֑ךְ לְמַ֙עַן֙ יַאֲרִ֣יכוּ יָמֶ֔יךָ עַ֚ל הֽ͏ָאֲדָמָ֔ה אֲשֶׁר־יְהוָ֥ה אֱלֹהֶ֖יךָ נֹתֵ֥ן לָֽךְ׃
16 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.
כִּ֧י תֹועֲבַ֛ת יְהוָ֥ה אֱלֹהֶ֖יךָ כָּל־עֹ֣שֵׂה אֵ֑לֶּה כֹּ֖ל עֹ֥שֵׂה עָֽוֶל׃ פ
17 Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
זָכֹ֕ור אֵ֛ת אֲשֶׁר־עָשָׂ֥ה לְךָ֖ עֲמָלֵ֑ק בַּדֶּ֖רֶךְ בְּצֵאתְכֶ֥ם מִמִּצְרָֽיִם׃
18 Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.
אֲשֶׁ֨ר קָֽרְךָ֜ בַּדֶּ֗רֶךְ וַיְזַנֵּ֤ב בְּךָ֙ כָּל־הַנֶּחֱשָׁלִ֣ים אַֽחַרֶ֔יךָ וְאַתָּ֖ה עָיֵ֣ף וְיָגֵ֑עַ וְלֹ֥א יָרֵ֖א אֱלֹהִֽים׃
19 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị Amalek, ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.
וְהָיָ֡ה בְּהָנִ֣יחַ יְהוָ֣ה אֱלֹהֶ֣יךָ ׀ לְ֠ךָ מִכָּל־אֹ֨יְבֶ֜יךָ מִסָּבִ֗יב בָּאָ֙רֶץ֙ אֲשֶׁ֣ר יְהוָֽה־אֱ֠לֹהֶיךָ נֹתֵ֨ן לְךָ֤ נַחֲלָה֙ לְרִשְׁתָּ֔הּ תִּמְחֶה֙ אֶת־זֵ֣כֶר עֲמָלֵ֔ק מִתַּ֖חַת הַשָּׁמָ֑יִם לֹ֖א תִּשְׁכָּֽח׃ פ

< Diuteronomi 25 >