< Diuteronomi 18 >

1 Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.
The Levitical priests, in fact the whole tribe of Levi, will not have a share in the land allotment with the other Israelites. They are to eat from the food offerings presented to the Lord—that is what they are entitled to receive.
2 Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.
While they don't own land among the other tribes, the Lord takes care of them, as he promised.
3 Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya.
The priests' share of a sacrifice of a bull or a sheep that is brought by the people is as follows. The priests are to be given the shoulder, the jaw, and the insides.
4 Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu.
You are to provide them with the firstfruits of your grain, new wine, and olive oil, as well as the first wool sheared from your flock.
5 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.
For the Lord your God has chosen Levi and his descendants from all your tribes to stand before him and serve in his name forever.
6 Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara,
If a Levite is convinced he should move from any Israelite town and goes to the place the Lord will choose,
7 ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
then he shall be allowed to serve in the name of the Lord his God like all his fellow Levites who stand there in service before the Lord.
8 Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.
They will all receive the same food allowances, despite him having received money from the sale of his father's property.
9 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ.
Once you enter the country the Lord your God is giving you, don't copy the offensive ways of the nations there.
10 Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja,
There should be no one who sacrifices their son or daughter in the fire, practices divination or fortune-telling, uses magic or sorcery,
11 maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.
practices witchcraft, visits a medium or spiritist, or communicates with the dead. Anyone does such things offends the Lord.
12 Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.
It's because of these offensive things that the Lord your God is driving out the nations before you.
13 Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
You are to be innocent of such things in the presence of the Lord your God.
14 Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
Even though these nations, whose land you will occupy, listen to magicians and fortune-tellers, the Lord your God forbids you to do so.
15 Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị.
The Lord your God will send you a prophet like me from your people. You must listen to him.
16 Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”
Remember what you told the Lord your God at Horeb when you were all assembled there. You said, “Please don't let us go on hearing the Lord our God speak to us, or see this terrifying fire anymore! Otherwise we're going to die!”
17 Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma.
Then the Lord told me, “They are right in what they're saying.
18 Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.
I'm going to send them a prophet like you from their people. I will give him my messages, and he will tell them everything I order him to say.
19 Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.
I will deal with anyone who does not listen to my message that the prophet speaks in my name.
20 Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”
However, if any prophet claims to be delivering a message in my name that I have not ordered him to give, or speaks in the name of other gods, that prophet must be executed.”
21 I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?”
You may be wondering, “How can we be sure that a message hasn't come from the Lord?”
22 Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha Onyenwe anyị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.
When a prophet speaks in the Lord's name and what he says doesn't happen or come true, then that is a not a message from the Lord. The prophet has spoken with contempt for the Lord. Don't be intimidated by him.

< Diuteronomi 18 >