< Diuteronomi 13 >

1 Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime,
너희 중에 선지자나 꿈 꾸는 자가 일어나서 이적과 기사를 네게 보이고
2 ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị,
네게 말하기를 네가 본래 알지 못하던 다른 신들을 우리가 좇아 섬기자 하며 이적과 기사가 그 말대로 이룰지라도
3 egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya.
너는 그 선지자나 꿈꾸는 자의 말을 청종하지 말라 이는 너희 하나님 여호와께서 너희가 마음을 다하고 성품을 다하여 너희 하나님 여호와를 사랑하는 여부를 알려 하사 너희를 시험하심이니라
4 Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
너희는 너희 하나님 여호와를 순종하며 그를 경외하며 그 명령을 지키며 그 목소리를 청종하며 그를 섬기며 그에게 부종하고
5 A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
그 선지자나 꿈 꾸는 자는 죽이라! 이는 그가 너희로 너희를 애굽 땅에서 인도하여 내시며 종 되었던 집에서 속량하여 취하신 너희 하나님 여호와를 배반케 하려 하며 너희 하나님 여호와께서 네게 행하라 명하신 도에서 너를 꾀어 내려고 말하였음이라 너는 이같이 하여 너희 중에서 악을 제할지니라
6 Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị,
네 동복 형제나 네 자녀나 네 품의 아내나 너와 생명을 함께 하는 친구가 가만히 너를 꾀어 이르기를 너와 네 열조가 알지 못하던 다른 신들
7 chi nke ndị ala ahụ gbara unu gburugburu, ma ha bụ ndị bi gị nso ma ha bụ ndị bi nʼebe dị anya, site nʼotu nsọtụ nke ala ahụ ruo nsọtụ nke ọzọ),
곧 네 사방에 둘러 있는 민족 혹 네게서 가깝든지 네게서 멀든지 땅 이 끝에서 저 끝까지 있는 민족의 신들을 우리가 가서 섬기자 할지라도
8 ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile.
너는 그를 좇지 말며 듣지 말며 긍휼히 보지 말며 애석히 여기지 말며 덮어 숨기지 말고
9 Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya.
너는 용서없이 그를 죽이되 죽일 때에 네가 먼저 그에게 손을 대고 후에 뭇 백성이 손을 대라
10 Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu.
그는 애굽 땅 종 되었던 집에서 너를 인도하여 내신 네 하나님 여호와에게서 너를 꾀어 떠나게 하려한 자니 너는 돌로 쳐 죽이라!
11 Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ.
그리하면 온 이스라엘이 듣고 두려워하여 이같은 악을 다시는 너희 중에서 행하지 못하리라
12 Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị,
네 하나님 여호와께서 네게 주어 거하게 하시는 한 성읍에 대하여 네게 소문이 들리기를
13 na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ),
너희 중 어떤 잡류가 일어나서 그 성읍 거민을 유혹하여 이르기를 너희가 알지 못하던 다른 신들을 우리가 가서 섬기자 한다 하거든
14 tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu,
너는 자세히 묻고 살펴보아서 이런 가증한 일이 참 사실로 너희 중에 있으면
15 ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha.
너는 마땅히 그 성읍 거민을 칼날로 죽이고 그 성읍과 그 중에 거하는 모든 것과 그 생축을 칼날로 진멸하고
16 Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.
또 그 속에서 빼앗아 얻은 물건을 다 거리에 모아 놓고 그 성읍과 그 탈취물 전부를 불살라 네 하나님 여호와께 드릴지니 그 성읍은 영영히 무더기가 되어 다시는 건축됨이 없을 것이니라
17 Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa.
너는 이 진멸할 물건을 조금도 네 손에 대지 말라 그리하면 여호와께서 그 진노를 그치시고 너를 긍휼히 여기시고 자비를 더하사 너의 열조에게 맹세하심 같이 네 수효를 번성케 하실 것이라
18 Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
네가 만일 네 하나님 여호와의 말씀을 듣고 오늘날 내가 네게 명하는 그 모든 명령을 지켜 네 하나님 여호와의 목전에 정직을 행하면 이같이 되리라

< Diuteronomi 13 >