< Daniel 8 >

1 Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ.
In the third year of the reign of king Belshazzar a vision appeared to me, Daniel, after that which appeared to me previously.
2 Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.
And I saw in the vision, and when I looked, I was in the citadel of Shushan, which is in the province of Elam. And I saw in the vision, and I was by the river Ulai.
3 Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.
Then I lifted up my eyes, and saw, and look, there stood before the river a ram which had two horns. And the two horns were long, but one was longer than the other, and the longer one came up last.
4 Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.
I saw the ram pushing westward, and northward, and southward; and no animals could stand before him, neither was there any who could deliver out of his hand. But he did according to his will, and became great.
5 Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.
As I was considering, look, a male goat came from the west over the surface of the whole earth, and did not touch the ground. And the goat had a prominent horn between his eyes.
6 Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ.
He came to the ram that had the two horns, which I saw standing before the river, and rushed at him in the fury of his power.
7 Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya.
I saw him come close to the ram, and he was moved with anger against him, and struck the ram, and broke his two horns. And there was no power in the ram to stand before him, but he threw him down to the ground and trampled on him, and there was no one who could deliver the ram from his power.
8 Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe,
The male goat became very strong. But when he was strong, the large horn was broken; and instead of it there came up four prominent horns toward the four winds of heaven.
9 Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ
Out of one of them came forth a little horn, which grew exceeding great, toward the south, and toward the east, and toward the beautiful land.
10 O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha.
It grew so great that it reached to the host of heaven, and some of the host and of the stars it cast down to the ground, and trampled on them.
11 O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
And it magnified itself, even against the Prince of the host; and it took away from him the daily sacrifice, and the place of his sanctuary was thrown down.
12 Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
The host was given over to it together with the daily sacrifice because of transgression. And it cast down truth to the ground, and kept prospering.
13 Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”
Then I heard a holy one speaking; and another holy one said to that certain one who spoke, "How long shall be the vision concerning the daily sacrifice, and the transgression that makes desolate, to give both the sanctuary and the host to be trampled?"
14 Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
He said to me, "To two thousand and three hundred evenings and mornings; then shall the sanctuary be restored to its rightful state."
15 Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m.
It came about when I, Daniel, had seen the vision, that I sought to understand it. And look, there stood before me someone who appeared to be a man.
16 Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”
I heard a man's voice between the banks of the Ulai, and called out and said, "Gabriel, make this man understand the vision."
17 Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”
So he came near where I stood, and when he came I was frightened, and fell prostrate. But he said to me, "Understand, son of man, that the vision belongs to the time of the end."
18 Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.
Now as he was speaking with me, I fell into a deep sleep with my face toward the ground; but he touched me, and stood me upright.
19 Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.
He said, "Look, I will make you know what shall be in the latter time of wrath, for it belongs to the appointed time of the end.
20 Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.
The ram which you saw, that had the two horns, they are the kings of Media and Persia.
21 Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.
The male goat is the king of Greece, and the large horn that is between his eyes is the first king.
22 Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.
As for that which was broken, in the place where four stood up, four kingdoms shall arise out of his nation, but not with his power.
23 “Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.
In the latter time of their kingdom, when the transgressions have reached their full measure, a rash and deceitful king shall arise.
24 Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi.
His power shall be great, but not by his own strength; and he shall cause terrible destruction, and shall succeed in whatever he does. And he shall destroy the mighty and the holy people.
25 Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ.
Through his cunning he shall cause deceit to prosper by his influence, and he shall be great in his own mind, and without warning he shall destroy many. He shall also stand up against the Prince of princes; but he shall be shattered, but not by human hands.
26 “Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.”
The vision of the evenings and mornings which has been told is true; but seal up the vision because it refers to many days from now."
27 Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta.
I, Daniel, was overcome, and was ill for days. Then I rose up, and carried out the king's business. And I was astonished by the vision, but there was no one to explain it.

< Daniel 8 >