< 1 Timoti 2 >

1 Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile, 2 kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ. 3 Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. 4 Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu. 5 Nʼihi na ọ bụ naanị otu Chineke dị. Ọ bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ. 6 Onye weere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nʼihi mmadụ niile, nke bụ ịgba ama a na-enye nʼoge ya. 7 Nʼihi nke a, a họpụtara m ka m bụrụ ọnụ na-ekwuru ọha nakwa onyeozi, na onye nkuzi nye ndị mba ọzọ banyere ezi okwukwe ahụ. Eziokwu ka m na-ekwu, anaghị m agha ụgha. 8 Nʼihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom, nʼebe niile na-achili aka dị nsọ elu nʼekpere, na-ebughị iwe nʼobi, na-arụkwaghị ụka. 9 Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi. 10 Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke. 11 Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. 12 Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ. 13 Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv. 14 Ọ bụkwaghị Adam ka a ghọgburu, kama ọ bụ nwanyị ka a ghọgburu mee ka ọ bụrụ onye mmebi iwu. 15 Ma a ga-azọpụta ha site nʼọmụmụ nwa ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuruoke.

< 1 Timoti 2 >