< 1 Ndị Eze 7 >

1 Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.
And Solomon was thirteen years building his own house, and he finished all his house.
2 O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ.
For he built the house of the forest of Lebanon. The length of it was a hundred cubits, and the breadth of it fifty cubits, and the height of it thirty cubits, upon four rows of cedar pillars, with cedar beams upon the pillars.
3 Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.
And it was covered with cedar above over the forty-five beams that were upon the pillars, fifteen in a row.
4 Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.
And there were beams in three rows, and window was opposite window in three ranks.
5 Ọnụ ụzọ niile nwere mbudo ọnụ ụzọ anọ. Ha dị atọ atọ cherịtara ibe ha ihu nʼebe mpụta ya.
And all the doors and posts were made square with beams, and window was opposite window in three ranks.
6 O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.
And he made the porch of pillars. The length of it was fifty cubits, and the breadth of it thirty cubits, and a porch in front of them, and pillars and a threshold in front of them.
7 E nwekwara ọnụ ụlọ ọzọ a na-akpọ, Ụlọ Ocheeze, maọbụ Ụlọ Ikpe ziri ezi ebe Solomọn na-anọ ekpe ikpe. E ji osisi sida machie ahụ ya niile, site nʼala ruo nʼelu.
And he made the porch of the throne where he was to judge, even the porch of judgment. And it was covered with cedar from floor to floor.
8 Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ.
And his house where he was to dwell, the other court within the porch was of the like work. He also made a house for Pharaoh's daughter (whom Solomon had taken to wife), like this porch.
9 E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya.
All these were of costly stones, even of hewn stone, according to measure, sawed with saws, inside and outside, even from the foundation to the coping, and so on the outside to the great court.
10 Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii.
And the foundation was of costly stones, even great stones, stones of ten cubits, and stones of eight cubits.
11 Nʼelu nkume ndị a ka e doro nkume ndị ọzọ, ndị dị ezi mma, a waziri awazi dịka ọtụtụ si dị. Emesịa, e dokwara osisi sida nʼelu ha.
And above were costly stones, even hewn stone, according to measure, and cedar-wood.
12 Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya.
And the great court round about had three courses of hewn stone, and a course of cedar beams, like the inner court of the house of Jehovah, and the porch of the house.
13 Eze Solomọn zigara ozi na Taịa, ka a kpọta Huram.
And king Solomon sent and fetched Hiram out of Tyre.
14 Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ.
He was the son of a widow of the tribe of Naphtali, and his father was a man of Tyre, a workman in brass. And he was filled with wisdom and understanding and skill, to work all works in brass. And he came to king Solomon, and wrought all his work.
15 Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.
For he fashioned the two pillars of brass, eighteen cubits high apiece. And a line of twelve cubits encompassed each of them around.
16 Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.
And he made two capitals of molten brass to set upon the tops of the pillars. The height of the one capital was five cubits, and the height of the other capital was five cubits.
17 E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.
There were nets of checker-work, and wreaths of chain-work, for the capitals which were upon the top of the pillars; seven for the one capital, and seven for the other capital.
18 Ọ kpụrụ ihe yiri mkpụrụ pomegranet, nke dị nʼahịrị abụọ, nke o ji gbaa ihe ịchọ mma ndị ahụ gburugburu, maka iji ha chọọ ihe ọkpụkpụ ọla ndị ahụ dị nʼelu ogidi ndị ahụ mma. O mere otu ihe a maka ihe ọkpụkpụ ọla ọbụla.
So he made the pillars. And there were two rows round about upon the one network to cover the capitals that were upon the top of the pillars. And so he did for the other capital.
19 Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.
And the capitals that were upon the top of the pillars in the porch were of lily-work, four cubits.
20 Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha.
And there were capitals also above upon the two pillars, close by the protuberance which was beside the network. And the pomegranates were two hundred, in rows round about upon the other capital.
21 O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ na mgbe ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
And he set up the pillars at the porch of the temple. And he set up the right pillar, and called the name of it Jachin, and he set up the left pillar, and called the name of it Boaz.
22 Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.
And upon the top of the pillars was lily-work: so was the work of the pillars finished.
23 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
And he made the molten sea of ten cubits from brim to brim, round in compass, and the height of it was five cubits. And a line of thirty cubits encompassed it round about.
24 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ọba gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ọba ndị a dị nʼahịrị abụọ, awụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
And under the brim of it round about there were knops which encompassed it, for ten cubits, encompassing the sea round about. The knops were in two rows, cast when it was cast.
25 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
It stood upon twelve oxen, three looking toward the north, and three looking toward the west, and three looking toward the south, and three looking toward the east. And the sea was set upon them above, and all their hinder parts were inward.
26 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ.
And it was a handbreadth thick. And the brim of it was wrought like the brim of a cup, like the flower of a lily. It held two thousand baths.
27 O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.
And he made the ten bases of brass; four cubits was the length of one base, and four cubits the breadth of it, and three cubits the height of it.
28 Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.
And the work of the bases was on this manner: They had panels, and there were panels between the ledges.
29 Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.
And on the panels that were between the ledges were lions, oxen, and cherubim. And upon the ledges there was a pedestal above. And beneath the lions and oxen were wreaths of hanging work.
30 Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.
And every base had four brazen wheels, and axles of brass. And the four corners of it had supports. Beneath the laver were the molten supports with wreaths at the side of each.
31 Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.
And the mouth of it within the capital and above was a cubit. And the mouth of it was round after the work of a pedestal, a cubit and a half. And also upon the mouth of it were engravings. And their panels were foursquare, not round.
32 A na-adọkpụgharị ihe ndọkwasị a nʼụkwụ anọ o nwere. A dụnyekọtakwara ụkwụ anọ ndị a nʼime okporo ọla e mekọtara ya na ihe ndọkwasị ahụ. Ịdị elu nke ụkwụ ọbụla bụ iri sentimita isii na asatọ.
And the four wheels were underneath the panels. And the axletrees of the wheels were in the base. And the height of a wheel was a cubit and half a cubit.
33 E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.
And the work of the wheels was like the work of a chariot wheel. Their axletrees, and their felloes, and their spokes, and their naves, were all molten.
34 Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.
And there were four supports at the four corners of each base. The supports of it were of the base itself.
35 E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.
And in the top of the base there was a round band half a cubit high. And on the top of the base the ledges of it and the panels of it were of the same.
36 Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.
And on the plates of the ledges of it, and on the panels of it, he engraved cherubim, lions, and palm trees, according to the space of each, with wreaths round about.
37 Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.
After this manner he made the ten bases: all of them had one casting, one measure, and one form.
38 Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.
And he made ten basins of brass. One basin contained forty baths. And every basin was four cubits. And upon every one of the ten bases one basin.
39 Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda.
And he set the bases, five on the right side of the house, and five on the left side of the house. And he set the sea on the right side of the house eastward, toward the south.
40 Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
And Hiram made the basins, and the shovels, and the bowls. So Hiram made an end of doing all the work that he wrought for king Solomon in the house of Jehovah:
41 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma.
the two pillars, and the two bowls of the capitals that were on the top of the pillars, and the two networks to cover the two bowls of the capitals that were on the top of the pillars,
42 Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.
and the four hundred pomegranates for the two networks, two rows of pomegranates for each network, to cover the two bowls of the capitals that were upon the pillars,
43 Ihe ndọkwasị iri na efere ịsa mmiri iri nke dọkwasịrị nʼelu ha;
and the ten bases, and the ten basins on the bases,
44 na Oke osimiri ahụ na oke ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru;
and the one sea, and the twelve oxen under the sea,
45 ite niile, shọvel niile na efere ịkwọsa mmiri. Ihe ndị a niile nke Huram meere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz na-egbu maramara ka eji mee ha.
and the pots, and the shovels, and the bowls. And all these vessels, which Hiram made for king Solomon in the house of Jehovah were of burnished brass.
46 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
The king cast them in the plain of the Jordan, in the clay ground between Succoth and Zarethan.
47 Ma Solomọn atụghị ihe ndị a niile a kpụrụ nʼihe ọtụtụ, nʼihi na ha dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ, achọpụtaghịkwa ịdị arọ nke bronz ahụ.
And Solomon left all the vessels unweighed because they were very many; the weight of the brass could not be found out.
48 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
And Solomon made all the vessels that were in the house of Jehovah: the golden altar, and the table whereupon the showbread was, of gold,
49 E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe, nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile;
and the lampstands, five on the right side, and five on the left, before the oracle, of pure gold, and the flowers, and the lamps, and the tongs, of gold,
50 na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.
and the cups, and the snuffers, and the basins, and the spoons, and the firepans, of pure gold, and the hinges, both for the doors of the inner house, the most holy place, and for the doors of the house, namely, of the temple, of gold.
51 Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Thus all the work that king Solomon wrought in the house of Jehovah was finished. And Solomon brought in the things which David his father had dedicated-the silver, and the gold, and the vessels-and put them in the treasuries of the house of Jehovah.

< 1 Ndị Eze 7 >