< 1 Ihe E Mere 9 >

1 E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
و تمامي اسرائيل بر حسب نسب نامه هاي خود شمرده شدند، و اينک در کتاب پادشاهان اسرائيل مکتوب اند و يهودا به سبب خيانت خود به بابل اسيري رفتند.۱
2 Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
و کساني که اول در مُلکها و شهرهاي ايشان سکونت داشتند، اسرائيليان و کاهنان و لاويان و نَتينيم بودند.۲
3 Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
و در اورشليم بعضي از بني يهودا واز بني بنيامين و از بني افرايم و مَنَّسي ساکن بودند.۳
4 Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
عوتاي ابن عمَّيهُود بن عُمرِي ابن اِمرِي ابن باني از بني فارَص بن يهودا.۴
5 Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
و از شيلونيان نخست زاده اش عسايا و پسران او.۵
6 Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu.
و از بني زارَح يعُوئيل و براران ايشان ششصد و نود نفر.۶
7 Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
و از بني بنيامين سَلُّو ابن مَشُلاّمِ بن هُودُويا ابن هَسنُوآه.۷
8 na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
و يبنِيا ابن يرُوحام و اِيلَة بن عُزِّي ابن مِکرِي و مَشُلاّم بن شَفَطيا بن رَاؤئيل بن يبنِيا.۸
9 Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii.
و برادران ايشان بر حسب انساب ايشان نه صد و پنجاه و شش نفر. جميع اينها رؤساي اجداد بر حسب خاندانهاي آباي ايشان بودند.۹
10 Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;
و از کاهنان، يدَعيا و يهُوياريب و ياکين،۱۰
11 Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.
عَزَريا ابن حِلقيا ابن مَشُلاّم بن صادوق بن مَرايوت بن اَخيطُوب رئيس خانه خدا،۱۱
12 Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea
و عَدايا ابن يرُوحام بن فَشحُور بن مَلکيا و مَعَساي ابن عَديئيل بن يحزيره بن مَشُلاّم بن مَشِليمِيت بن اِمّير.۱۲
13 Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii. Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.
و برادران ايشان که رؤساي خاندان آباي ايشان بودند، هزار و هفتصد شصت نفر که مردان رشيد به جهت عمل خدمت خانه خدا بودند.۱۳
14 Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
و از لاويان شَمَعيا ابن حَشُّوب بن عَزريقام بن حَشَبيا از بني مَراري.۱۴
15 Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
و بَقبَقَّر و حارَش و جَلال و مَتَنيا ابن ميکا ابن زِکرِي ابن آساف.۱۵
16 Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
و عَوبَديا ابن شَمَعيا ابن جَلال و بن يدُوتُون و بَرخِيا ابن آسا ابن اَلقانَه که در دهات نَطُوفاتيان ساکن بود.۱۶
17 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
و در بانان، شَلُّوم و عَقُّوب و طَلمُون و اَخِيمان و برادران ايشان. و شَلُّوم رئيس بود.۱۷
18 Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
و ايشان تا الآن بر دروازه شرقي پادشاه (مي باشند) و در بانانِ فرقه بني لاوي بودند.۱۸
19 Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
و شَلُّوم بن قُورِي ابن اَبيآ ساف بن قُورَح و برادرانش از خاندان پدرش يعني بني قُورَح که ناظران عمل خدمت و مستحفظان دروازه هاي خيمه بودند و پدران ايشان ناظران اُردوي خداوند و مستحفظان مدخل آن بودند.۱۹
20 Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
و فينَحاس بن اَلعازار، سابق رئيس ايشان بود. و خداوند با وي مي بود.۲۰
21 Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
و زکريا ابن مَشَلَمِيا دربان دروازه خيمه اجتماع بود.۲۱
22 Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ. E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
و جميع ايناني که براي درباني دروازه ها منتخب شدند، دويست دوازده نفر بودند و ايشان در دهات خود بر حسب نسب نامه هاي خود شمرده شدند که داود و سموئيلِ رائي ايشان را بر وظيفه هاي ايشان گماشته بودند.۲۲
23 Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
پس ايشان و پسران ايشان بر دروازه هاي خانه خداوند و خانه خيمه براي نگهباني آن گماشته شدند.۲۳
24 Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
و دربانان به هر چهار طرف يعني مشرق و مغرب و شمال و جنوب بودند.۲۴
25 Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
و برادران ايشان که در دهات خود بودند، هر هفت روز نوبت به نوبت با ايشان مي آمدند.۲۵
26 Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
زيرا چهار رئيس دربانان که لاويان بودند، منصب خاصّ داشتند و ناظرانِ حجره ها و خزانه هاي خانه خدا بودند.۲۶
27 Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
و به اطراف خانه خدا منزل داشتند زيرا که نگاه بانيش بر ايشان بود، و باز کردن آن هر صبح بر ايشان بود.۲۷
28 Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
و بعضي از ايشان بر آلات خدمت مأمور بودند، چونکه آنها را به شماره مي آوردند و به شماره بيرون مي بردند.۲۸
29 Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
از ايشان بر اسباب و جميع آلات قدس و آردِ نرم و شراب و روغن و بخور و عطريات مأمور بودند.۲۹
30 Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
و بعضي از پسران کاهنان، عطريات خوشبو را ترکيب مي کردند.۳۰
31 Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
و مَتَّتيا که از جمله لاويان و نخست زاده شَلُّوم قُورَحي بود، بر عمل مطبوخات گماشته شده بود.۳۱
32 Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.
و بعضي از برادران ايشان از پسران قَهاتيان، بر نان تَقدِمه مأمور بودند تا آن را در هر روز سبت مهيا سازند.۳۲
33 Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
و مغنيان از رؤساي خاندان آباي لاويان در حجره ها سکونت داشتند و از کار ديگر فارغ بودند زيرا که روز و شب در کار خود مشغول مي بودند.۳۳
34 Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
اينان رؤساي خاندان آباي لاويان و بر حسب انساب خود رئيس بودند و در اورشليم سکونت داشتند.۳۴
35 Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
و در جِبعُون، پدر جِبعُون، يعوئيل سکونت داشت و اسم زنش مَعکَه بود.۳۵
36 Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
و نخست زاده اش عَبدون بود، پس صور و قَيس و بَعل و نير و ناداب،۳۶
37 Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.
و جَدُور و اَخِيو و زَکريا و مِقلُوت؛۳۷
38 Miklot bụ nna Shimeam. Ha onwe ha sokwa ụmụnna ha biri na Jerusalem.
و مِقلُوت شِمآم را آورد و ايشان نيز با برادران خود در اورشليم در مقابل برادران ايشان ساکن بودند.۳۸
39 Nea mụrụ Kish nna Sọl, onye bụ nna Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
و نير قَيس را آورد و قَيس شاؤل را آورد و شاؤل يهُوناتان و مَلکيشوع و ابيناداب و اَشبَعل را آورد.۳۹
40 Jonatan mụrụ Merib-Baal nna Maịka.
و پسر يهُوناتان، مَريب بَعل بود و مَريب بَعل ميکا را آورد.۴۰
41 Maịka mụrụ Piton, Melek, Tahrea na Ehaz.
و پسر ميکا، فيتون و مالَک و تَحريع و آحاز بودند.۴۱
42 Ehaz mụrụ Jada. Jada bụ nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
و آحاز يعرَه را آورد و يعره عَلمَت و عَزمُوت و زِمرِي را آورد و زِمرِي موصا را آورد.۴۲
43 Moza mụrụ Binea, nna Refaya, nna Eleasa, nna Azel.
و موصا بِنعا را آورد و پسرش رفايا و پسرش اَلعاسَه و پسرش آصيل.۴۳
44 Azel mụrụ ụmụ isii: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
و آصيل را شش پسر بود و اين است نامهاي ايشان: عَزرِيقام و بُکرُو و اسمَعيل و شَعَريا و عُوبَديا و حانان اينها پسران آصيل مي باشند.۴۴

< 1 Ihe E Mere 9 >