< תהילים 105 >

הודו ליהוה קראו בשמו הודיעו בעמים עלילותיו 1
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
שירו-לו זמרו-לו שיחו בכל-נפלאותיו 2
Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
התהללו בשם קדשו ישמח לב מבקשי יהוה 3
Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
דרשו יהוה ועזו בקשו פניו תמיד 4
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
זכרו--נפלאותיו אשר-עשה מפתיו ומשפטי-פיו 5
Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
זרע אברהם עבדו בני יעקב בחיריו 6
unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
הוא יהוה אלהינו בכל-הארץ משפטיו 7
Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
זכר לעולם בריתו דבר צוה לאלף דור 8
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
אשר כרת את-אברהם ושבועתו לישחק 9
ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
ויעמידה ליעקב לחק לישראל ברית עולם 10
O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
לאמר--לך אתן את-ארץ-כנען חבל נחלתכם 11
“Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
בהיותם מתי מספר כמעט וגרים בה 12
Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
ויתהלכו מגוי אל-גוי מממלכה אל-עם אחר 13
Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
לא-הניח אדם לעשקם ויוכח עליהם מלכים 14
O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
אל-תגעו במשיחי ולנביאי אל-תרעו 15
sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
ויקרא רעב על-הארץ כל-מטה-לחם שבר 16
O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
שלח לפניהם איש לעבד נמכר יוסף 17
o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu.
ענו בכבל רגליו (רגלו) ברזל באה נפשו 18
Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
עד-עת בא-דברו-- אמרת יהוה צרפתהו 19
tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
שלח מלך ויתירהו משל עמים ויפתחהו 20
Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
שמו אדון לביתו ומשל בכל-קנינו 21
O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
לאסר שריו בנפשו וזקניו יחכם 22
ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
ויבא ישראל מצרים ויעקב גר בארץ-חם 23
Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
ויפר את-עמו מאד ויעצמהו מצריו 24
Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
הפך לבם לשנא עמו להתנכל בעבדיו 25
ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
שלח משה עבדו אהרן אשר בחר-בו 26
O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
שמו-בם דברי אתותיו ומפתים בארץ חם 27
Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
שלח חשך ויחשך ולא-מרו את-דבריו (דברו) 28
O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
הפך את-מימיהם לדם וימת את-דגתם 29
O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
שרץ ארצם צפרדעים בחדרי מלכיהם 30
Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
אמר ויבא ערב כנים בכל-גבולם 31
O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
נתן גשמיהם ברד אש להבות בארצם 32
Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
ויך גפנם ותאנתם וישבר עץ גבולם 33
o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
אמר ויבא ארבה וילק ואין מספר 34
O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
ויאכל כל-עשב בארצם ויאכל פרי אדמתם 35
ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
ויך כל-בכור בארצם ראשית לכל-אונם 36
Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
ויוציאם בכסף וזהב ואין בשבטיו כושל 37
Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
שמח מצרים בצאתם כי-נפל פחדם עליהם 38
Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
פרש ענן למסך ואש להאיר לילה 39
Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
שאל ויבא שלו ולחם שמים ישביעם 40
Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
פתח צור ויזובו מים הלכו בציות נהר 41
O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
כי-זכר את-דבר קדשו את-אברהם עבדו 42
Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.
ויוצא עמו בששון ברנה את-בחיריו 43
O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
ויתן להם ארצות גוים ועמל לאמים יירשו 44
o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
בעבור ישמרו חקיו-- ותורתיו ינצרו הללו-יה 45
ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị.

< תהילים 105 >