< 1 Chroniques 14 >

1 Or Hiram, roi de Tyr, envoya des messagers à David, et du bois de cèdre, des tailleurs de pierres et des charpentiers, pour lui bâtir une maison.
Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ.
2 Et David connut que l'Éternel l'avait affermi comme roi sur Israël, et que sa royauté était haut élevée, à cause de son peuple d'Israël.
Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.
3 David prit encore des femmes à Jérusalem, et il engendra encore des fils et des filles.
Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
4 Voici les noms de ceux qui lui naquirent à Jérusalem: Shammua, Shobab, Nathan, Salomon,
Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
5 Jibhar, Élishua, Élpélet,
Ibha, Elishua, Elpelet,
6 Noga, Népheg, Japhia,
Noga, Nefeg, Jafia,
7 Élishama, Béeljada et Éliphélet.
Elishama, Beeliada na Elifelet.
8 Or les Philistins apprirent que David avait été oint comme roi sur tout Israël, et ils montèrent tous pour chercher David. Et David, l'ayant appris, sortit au-devant d'eux.
Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha.
9 Les Philistins vinrent donc, et se répandirent dans la vallée des Réphaïm.
Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.
10 Alors David consulta Dieu, et dit: Monterai-je contre les Philistins, et les livreras-tu entre mes mains? Et l'Éternel lui dit: Monte, et je les livrerai entre tes mains.
Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”
11 Et ils montèrent à Baal-Pératsim; et David les y battit, et dit: Dieu a dispersé mes ennemis par ma main, comme un débordement d'eaux. C'est pourquoi on appela ce lieu Baal-Pératsim (Lieu des ruptures).
Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.
12 Ils laissèrent là leurs dieux, et David commanda qu'on les brûlât.
Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
13 Cependant les Philistins se répandirent de nouveau dans cette vallée.
Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ.
14 Et David consulta encore Dieu; et Dieu lui dit: Tu ne monteras pas après eux; détourne-toi d'eux, et tu viendras contre eux vis-à-vis des mûriers.
Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
15 Et quand tu entendras un bruit de pas au sommet des mûriers, alors tu sortiras pour combattre; car Dieu sera sorti devant toi pour frapper le camp des Philistins.
Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
16 David fit donc ce que Dieu lui avait commandé; et ils frappèrent le camp des Philistins depuis Gabaon jusqu'à Guézer.
Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.
17 Et la renommée de David se répandit dans tous les pays, et l'Éternel mit la frayeur de son nom sur toutes les nations.
Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.

< 1 Chroniques 14 >