< Esther 10 +

1 King Ahasuerus imposed a tribute on the land and the coasts.
Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ.
2 All the acts of his power and of his might, and the full account of the greatness of Mordecai to which the king advanced him, are they not recorded in the book of the chronicles of the kings of Media and Persia?
Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha.
3 For Mordecai the Jew was next in rank to King Ahasuerus, and great among the Jews, and loved by them all. He sought the good of his people and promoted the welfare of their descendants.
Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.

< Esther 10 +