< Matthew 11 >

1 When Jesus had finished directing his twelve disciples, he departed from there to teach and preach in their cities.
Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.
2 Now when John heard in the prison the works of Christ, he sent two of his disciples
Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
3 and said to him, “Are you he who comes, or should we look for another?”
Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?”
4 Jesus answered them, “Go and tell John the things which you hear and see:
Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ.
5 the blind receive their sight, the lame walk, the lepers are cleansed, the deaf hear, the dead are raised up, and the poor have good news preached to them.
Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.
6 Blessed is he who finds no occasion for stumbling in me.”
Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
7 As these went their way, Jesus began to say to the multitudes concerning John, “What did you go out into the wilderness to see? A reed shaken by the wind?
Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
8 But what did you go out to see? A man in soft clothing? Behold, those who wear soft clothing are in kings’ houses.
Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze.
9 But why did you go out? To see a prophet? Yes, I tell you, and much more than a prophet.
Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.
10 For this is he, of whom it is written, ‘Behold, I send my messenger before your face, who will prepare your way before you.’
Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
11 Most certainly I tell you, among those who are born of women there has not arisen anyone greater than John the Baptizer; yet he who is least in the Kingdom of Heaven is greater than he.
Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya.
12 From the days of John the Baptizer until now, the Kingdom of Heaven suffers violence, and the violent take it by force.
Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya.
13 For all the prophets and the law prophesied until John.
Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a.
14 If you are willing to receive it, this is Elijah, who is to come.
Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa.
15 He who has ears to hear, let him hear.
Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
16 “But to what shall I compare this generation? It is like children sitting in the marketplaces, who call to their companions
“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nʼama, ndị na-asị ibe ha,
17 and say, ‘We played the flute for you, and you did not dance. We mourned for you, and you did not lament.’
“‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’
18 For John came neither eating nor drinking, and they say, ‘He has a demon.’
Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
19 The Son of Man came eating and drinking, and they say, ‘Behold, a gluttonous man and a drunkard, a friend of tax collectors and sinners!’ But wisdom is justified by her children.”
Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”
20 Then he began to denounce the cities in which most of his mighty works had been done, because they did not repent.
Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị.
21 “Woe to you, Chorazin! Woe to you, Bethsaida! For if the mighty works had been done in Tyre and Sidon which were done in you, they would have repented long ago in sackcloth and ashes.
“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi.
22 But I tell you, it will be more tolerable for Tyre and Sidon on the day of judgment than for you.
Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.
23 You, Capernaum, who are exalted to heaven, you will go down to Hades (Hadēs g86). For if the mighty works had been done in Sodom which were done in you, it would have remained until today.
Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. (Hadēs g86)
24 But I tell you that it will be more tolerable for the land of Sodom on the day of judgment, than for you.”
Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
25 At that time, Jesus answered, “I thank you, Father, Lord of heaven and earth, that you hid these things from the wise and understanding, and revealed them to infants.
Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
26 Yes, Father, for so it was well-pleasing in your sight.
E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
27 All things have been delivered to me by my Father. No one knows the Son, except the Father; neither does anyone know the Father, except the Son and he to whom the Son desires to reveal him.
“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
28 “Come to me, all you who labor and are heavily burdened, and I will give you rest.
“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
29 Take my yoke upon you and learn from me, for I am gentle and humble in heart; and you will find rest for your souls.
Nyaranụ yokunke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.
30 For my yoke is easy, and my burden is light.”
Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

< Matthew 11 >