< John 4 >

1 Therefore when the Lord knew that the Pharisees had heard that Jesus was making and baptizing more disciples than John
Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
2 (although Jesus himself did not baptize, but his disciples),
Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
3 he left Judea and departed into Galilee.
Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
4 He needed to pass through Samaria.
Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
5 So he came to a city of Samaria called Sychar, near the parcel of ground that Jacob gave to his son Joseph.
Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
6 Jacob’s well was there. Jesus therefore, being tired from his journey, sat down by the well. It was about the sixth hour.
Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
7 A woman of Samaria came to draw water. Jesus said to her, “Give me a drink.”
Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
8 For his disciples had gone away into the city to buy food.
(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
9 The Samaritan woman therefore said to him, “How is it that you, being a Jew, ask for a drink from me, a Samaritan woman?” (For Jews have no dealings with Samaritans.)
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
10 Jesus answered her, “If you knew the gift of God, and who it is who says to you, ‘Give me a drink,’ you would have asked him, and he would have given you living water.”
Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
11 The woman said to him, “Sir, you have nothing to draw with, and the well is deep. So where do you get that living water?
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
12 Are you greater than our father Jacob, who gave us the well and drank from it himself, as did his children and his livestock?”
Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”
13 Jesus answered her, “Everyone who drinks of this water will thirst again,
Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
14 but whoever drinks of the water that I will give him by no means will thirst for the age (aiōn g165); but the water that I will give him will become in him a well of water springing up to consummate (aiōnios g166) life."
Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” (aiōn g165, aiōnios g166)
15 The woman said to him, “Sir, give me this water, so that I do not get thirsty, neither come all the way here to draw.”
Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
16 Jesus said to her, “Go, call your husband, and come here.”
Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
17 The woman answered, “I have no husband.” Jesus said to her, “You said well, ‘I have no husband,’
Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.
18 for you have had five husbands; and he whom you now have is not your husband. This you have said truly.”
I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
19 The woman said to him, “Sir, I perceive that you are a prophet.
Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
20 Our fathers worshiped in this mountain, and you Jews say that in Jerusalem is the place where people ought to worship.”
Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
21 Jesus said to her, “Woman, believe me, the hour is coming when neither in this mountain nor in Jerusalem will you worship the Father.
Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
22 You worship that which you do not know. We worship that which we know; for salvation is from the Jews.
Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
23 But the hour comes, and now is, when the true worshipers will worship the Father in spirit and truth, for the Father seeks such to be his worshipers.
Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
24 God is spirit, and those who worship him must worship in spirit and truth.”
Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
25 The woman said to him, “I know that Messiah is coming, he who is called Christ. When he has come, he will declare to us all things.”
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
26 Jesus said to her, “I am he, the one who speaks to you.”
Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
27 Just then, his disciples came. They marveled that he was speaking with a woman; yet no one said, “What are you looking for?” or, “Why do you speak with her?”
Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
28 So the woman left her water pot, went away into the city, and said to the people,
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
29 “Come, see a man who told me everything that I have done. Can this be the Christ?”
“Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
30 They went out of the city, and were coming to him.
Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
31 In the meanwhile, the disciples urged him, saying, “Rabbi, eat.”
Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
32 But he said to them, “I have food to eat that you do not know about.”
Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”
33 The disciples therefore said to one another, “Has anyone brought him something to eat?”
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
34 Jesus said to them, “My food is to do the will of him who sent me and to accomplish his work.
Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
35 Do not you say, ‘There are yet four months until the harvest’? Behold, I tell you, lift up your eyes and look at the fields, that they are white for harvest already.
Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
36 He who reaps receives wages and gathers fruit to consummate (aiōnios g166) life; that both he who sows and he who reaps may rejoice together.
Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. (aiōnios g166)
37 For in this the saying is true, ‘One sows, and another reaps.’
Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’
38 I sent you to reap that for which you have not labored. Others have labored, and you have entered into their labor.”
E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”
39 From that city many of the Samaritans believed in him because of the word of the woman, who testified, “He told me everything that I have done.”
Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
40 So when the Samaritans came to him, they begged him to stay with them. He stayed there two days.
Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
41 Many more believed because of his word.
Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
42 They said to the woman, “Now we believe, not because of your speaking; for we have heard for ourselves, and know that this is indeed the Christ, the Savior of the world.”
Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
43 After the two days he went out from there and went into Galilee.
Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
44 For Jesus himself testified that a prophet has no honor in his own country.
(Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
45 So when he came into Galilee, the Galileans received him, having seen all the things that he did in Jerusalem at the feast, for they also went to the feast.
Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.
46 Jesus came therefore again to Cana of Galilee, where he made the water into wine. There was a certain nobleman whose son was sick at Capernaum.
Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.
47 When he heard that Jesus had come out of Judea into Galilee, he went to him and begged him that he would come down and heal his son, for he was at the point of death.
Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
48 Jesus therefore said to him, “Unless you see signs and wonders, you will in no way believe.”
Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”
49 The nobleman said to him, “Sir, come down before my child dies.”
Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
50 Jesus said to him, “Go your way. Your son lives.” The man believed the word that Jesus spoke to him, and he went his way.
Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.
51 As he was going down, his servants met him and reported, saying “Your child lives!”
Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.
52 So he inquired of them the hour when he began to get better. They said therefore to him, “Yesterday at the seventh hour, the fever left him.”
Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
53 So the father knew that it was at that hour in which Jesus said to him, “Your son lives.” He believed, as did his whole house.
Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
54 This is again the second sign that Jesus did, having come out of Judea into Galilee.
Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

< John 4 >