< Acts 20 >

1 After the uproar had ceased, Paul sent for the disciples, took leave of them, and departed to go into Macedonia.
Mgbe ọgbaaghara ndị a kwụsịrị, Pọl kpọkwara ndị na-eso ụzọ ahụ, gbaa ha ume, gwa ha ka ha nọdụ nke ọma, ọ pụrụ gawa Masidonia.
2 When he had gone through those parts and had encouraged them with many words, he came into Greece.
Mgbe ọ gagharịchara nʼakụkụ ala ahụ niile, werekwa okwu nkasiobi gbaa ndị ụmụnna ume, ọ bịaruru ala Griis.
3 When he had spent three months there, and a plot was made against him by Jews as he was about to set sail for Syria, he determined to return through Macedonia.
Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.
4 These accompanied him as far as Asia: Sopater of Beroea, Aristarchus and Secundus of the Thessalonians, Gaius of Derbe, Timothy, and Tychicus and Trophimus of Asia.
Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Arịstakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi na Timoti, na Taịkikọs na Trofimọs, ndị Eshịa sokwa ya na-aga ije a.
5 But these had gone ahead, and were waiting for us at Troas.
Ndị a bu ụzọ gawa, na-eche anyị na Troas.
6 We sailed away from Philippi after the days of Unleavened Bread, and came to them at Troas in five days, where we stayed seven days.
Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa.
7 On the first day of the week, when the disciples were gathered together to break bread, Paul talked with them, intending to depart on the next day; and continued his speech until midnight.
Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.
8 There were many lights in the upper room where we were gathered together.
Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.
9 A certain young man named Eutychus sat in the window, weighed down with deep sleep. As Paul spoke still longer, being weighed down by his sleep, he fell down from the third floor and was taken up dead.
Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.
10 Paul went down and fell upon him, and embracing him said, “Do not be troubled, for his life is in him.”
Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”
11 When he had gone up, had broken bread and eaten, and had talked with them a long while, even until break of day, he departed.
Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya.
12 They brought the boy in alive, and were greatly comforted.
Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
13 But we, going ahead to the ship, set sail for Assos, intending to take Paul aboard there; for he had so arranged, intending himself to go by land.
Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.
14 When he met us at Assos, we took him aboard and came to Mitylene.
Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.
15 Sailing from there, we came the following day opposite Chios. The next day we touched at Samos and stayed at Trogyllium, and the day after we came to Miletus.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.
16 For Paul had determined to sail past Ephesus, that he might not have to spend time in Asia; for he was hastening, if it were possible for him, to be in Jerusalem on the day of Pentecost.
Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.
17 From Miletus he sent to Ephesus and called to himself the elders of the assembly.
Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.
18 When they had come to him, he said to them, “You yourselves know, from the first day that I set foot in Asia, how I was with you all the time,
Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.
19 serving the Lord with all humility, with many tears, and with trials which happened to me by the plots of the Jews;
Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.
20 how I did not shrink from declaring to you anything that was profitable, teaching you publicly and from house to house,
Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.
21 testifying both to Jews and to Greeks repentance toward God and faith toward our Lord Jesus.
E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.
22 Now, behold, I go bound by the Spirit to Jerusalem, not knowing what will happen to me there;
“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.
23 except that the Holy Spirit testifies in every city, saying that bonds and afflictions wait for me.
Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.
24 But these things do not count; nor do I hold my life dear to myself, so that I may finish my race with joy, and the ministry which I received from the Lord Jesus, to fully testify to the Good News of the grace of God.
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
25 “Now, behold, I know that you all, among whom I went about preaching God’s Kingdom, will see my face no more.
“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26 Therefore I testify to you today that I am clean from the blood of all men,
Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27 for I did not shrink from declaring to you the whole counsel of God.
Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28 Take heed, therefore, to yourselves and to all the flock, in which the Holy Spirit has made you overseers, to shepherd the assembly of the Lord and God which he purchased with his own blood.
Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
29 For I know that after my departure, vicious wolves will enter in among you, not sparing the flock.
Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
30 Men will arise from among your own selves, speaking perverse things, to draw away the disciples after them.
Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
31 Therefore watch, remembering that for a period of three years I did not cease to admonish everyone night and day with tears.
Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
32 Now, brothers, I entrust you to God and to the word of his grace, which is able to build up and to give you the inheritance among all those who are sanctified.
“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
33 I coveted no one’s silver, gold, or clothing.
Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.
34 You yourselves know that these hands served my necessities, and those who were with me.
Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.
35 In all things I gave you an example, that so laboring you ought to help the weak, and to remember the words of the Lord Jesus, that he himself said, ‘It is more blessed to give than to receive.’”
Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’”
36 When he had spoken these things, he knelt down and prayed with them all.
Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere.
37 They all wept freely, and fell on Paul’s neck and kissed him,
Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ.
38 sorrowing most of all because of the word which he had spoken, that they should see his face no more. Then they accompanied him to the ship.
O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.

< Acts 20 >