< 1 Corinthians 11 >

1 Be imitators of me, even as I also am of Christ.
Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst.
2 Now I praise you, brothers, that you remember me in all things, and hold firm the traditions, even as I delivered them to you.
Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe.
3 But I would have you know that the head of every man is Christ, and the head of the woman is man, and the head of Christ is God.
Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.
4 Every man praying or prophesying, having his head covered, dishonors his head.
Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.
5 But every woman praying or prophesying with her head uncovered dishonors her head. For it is one and the same thing as if she were shaved.
Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya.
6 For if a woman is not covered, let her hair also be cut off. But if it is shameful for a woman to have her hair cut off or be shaved, let her be covered.
Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.
7 For a man indeed ought not to have his head covered, because he is the image and glory of God, but the woman is the glory of the man.
Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.
8 For man is not from woman, but woman from man;
E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.
9 for man was not created for the woman, but woman for the man.
E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.
10 For this cause the woman ought to have authority over her own head, because of the angels.
Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.
11 Nevertheless, neither is the woman independent of the man, nor the man independent of the woman, in the Lord.
Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
12 For as woman came from man, so a man also comes through a woman; but all things are from God.
Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.
13 Judge for yourselves. Is it appropriate that a woman pray to God unveiled?
Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke?
14 Does not even nature itself teach you that if a man has long hair, it is a dishonor to him?
Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo.
15 But if a woman has long hair, it is a glory to her, for her hair is given to her for a covering.
Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi.
16 But if any man seems to be contentious, we have no such custom, neither do God’s assemblies.
Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a.
17 But in giving you this command I do not praise you, because you come together not for the better but for the worse.
Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma.
18 For first of all, when you come together in the assembly, I hear that divisions exist among you, and I partly believe it.
Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
19 For there also must be factions among you, that those who are approved may be revealed among you.
Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara.
20 When therefore you assemble yourselves together, it is not the Lord’s supper that you eat.
Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri.
21 For in your eating each one takes his own supper first. One is hungry, and another is drunken.
Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.
22 What, do not you have houses to eat and to drink in? Or do you despise God’s assembly and put them to shame who do not have enough? What shall I tell you? Shall I praise you? In this I do not praise you.
A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.
23 For I received from the Lord that which also I delivered to you, that the Lord Jesus on the night in which he was betrayed took bread.
Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
24 When he had given thanks, he broke it and said, “Take, eat. This is my body, which is broken for you. Do this in memory of me.”
Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
25 In the same way he also took the cup after supper, saying, “This cup is the new covenant in my blood. Do this, as often as you drink, in memory of me.”
Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
26 For as often as you eat this bread and drink this cup, you proclaim the Lord’s death until he comes.
Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
27 Therefore whoever eats this bread or drinks the Lord’s cup in a way unworthy of the Lord will be guilty of the body and the blood of the Lord.
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị.
28 But let a man examine himself, and so let him eat of the bread and drink of the cup.
Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ.
29 For he who eats and drinks in an unworthy way eats and drinks judgment to himself if he does not discern the Lord’s body.
Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
30 For this cause many among you are weak and sickly, and not a few sleep.
Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ.
31 For if we discerned ourselves, we would not be judged.
Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe.
32 But when we are judged, we are disciplined by the Lord, that we may not be condemned with the world.
Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.
33 Therefore, my brothers, when you come together to eat, wait for one another.
Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu.
34 But if anyone is hungry, let him eat at home, lest your coming together be for judgment. The rest I will set in order whenever I come.
Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma. Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara.

< 1 Corinthians 11 >