< 雅歌 5 >

1 我妹子,我新婦, 我進了我的園中, 採了我的沒藥和香料, 吃了我的蜜房和蜂蜜, 喝了我的酒和奶。 〔耶路撒冷的眾女子〕 我的朋友們,請吃! 我所親愛的,請喝,且多多地喝!
Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Ndị Enyi Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
2 我身睡臥,我心卻醒。 這是我良人的聲音; 他敲門說: 〔新郎〕 我的妹子,我的佳偶, 我的鴿子,我的完全人, 求你給我開門; 因我的頭滿了露水, 我的頭髮被夜露滴濕。
A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
3 我回答說: 我脫了衣裳,怎能再穿上呢? 我洗了腳,怎能再玷污呢?
Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
4 我的良人從門孔裏伸進手來, 我便因他動了心。
Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
5 我起來,要給我良人開門。 我的兩手滴下沒藥; 我的指頭有沒藥汁滴在門閂上。
Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
6 我給我的良人開了門; 我的良人卻已轉身走了。 他說話的時候,我神不守舍; 我尋找他,竟尋不見; 我呼叫他,他卻不回答。
Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
7 城中巡邏看守的人遇見我, 打了我,傷了我; 看守城牆的人奪去我的披肩。
Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
8 耶路撒冷的眾女子啊,我囑咐你們: 若遇見我的良人, 要告訴他,我因思愛成病。
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
9 你這女子中極美麗的, 你的良人比別人的良人有何強處? 你的良人比別人的良人有何強處, 你就這樣囑咐我們?
Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
10 我的良人白而且紅, 超乎萬人之上。
Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
11 他的頭像至精的金子; 他的頭髮厚密纍垂,黑如烏鴉。
Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
12 他的眼如溪水旁的鴿子眼, 用奶洗淨,安得合式。
Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
13 他的兩腮如香花畦, 如香草臺; 他的嘴唇像百合花, 且滴下沒藥汁。
Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
14 他的兩手好像金管, 鑲嵌水蒼玉; 他的身體如同雕刻的象牙, 周圍鑲嵌藍寶石。
Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
15 他的腿好像白玉石柱, 安在精金座上; 他的形狀如黎巴嫩, 且佳美如香柏樹。
Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
16 他的口極其甘甜; 他全然可愛。 耶路撒冷的眾女子啊, 這是我的良人; 這是我的朋友。
Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.

< 雅歌 5 >