< 雅歌 2 >

1 我是沙崙的玫瑰花, 是谷中的百合花。
Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn, na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.
2 我的佳偶在女子中, 好像百合花在荊棘內。
E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.
3 我的良人在男子中, 如同蘋果樹在樹林中。 我歡歡喜喜坐在他的蔭下, 嘗他果子的滋味,覺得甘甜。
Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.
4 他帶我入筵宴所, 以愛為旗在我以上。
Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.
5 求你們給我葡萄乾增補我力, 給我蘋果暢快我心, 因我思愛成病。
Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
6 他的左手在我頭下; 他的右手將我抱住。
Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
7 耶路撒冷的眾女子啊, 我指着羚羊或田野的母鹿囑咐你們: 不要驚動、不要叫醒我所親愛的, 等他自己情願。
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.
8 聽啊!是我良人的聲音; 看哪!他躥山越嶺而來。
Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.
9 我的良人好像羚羊,或像小鹿。 他站在我們牆壁後, 從窗戶往裏觀看, 從窗欞往裏窺探。
Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya.
10 我良人對我說: 〔新郎〕 我的佳偶,我的美人, 起來,與我同去!
Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m.
11 因為冬天已往, 雨水止住過去了。
Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.
12 地上百花開放, 百鳥鳴叫的時候已經來到; 斑鳩的聲音在我們境內也聽見了。
Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile.
13 無花果樹的果子漸漸成熟; 葡萄樹開花放香。 我的佳偶,我的美人, 起來,與我同去!
Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ, isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
14 我的鴿子啊,你在磐石穴中, 在陡巖的隱密處。 求你容我得見你的面貌, 得聽你的聲音; 因為你的聲音柔和, 你的面貌秀美。
Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
15 要給我們擒拿狐狸, 就是毀壞葡萄園的小狐狸, 因為我們的葡萄正在開花。
Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
16 良人屬我,我也屬他; 他在百合花中牧放群羊。
Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
17 我的良人哪, 求你等到天起涼風、 日影飛去的時候, 你要轉回,好像羚羊, 或像小鹿在比特山上。
tutu chi ụtụtụ abọọ mgbe onyinyo niile na-agabigakwa. Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya, dị ka mgbada maọbụ nwa ele nke nọ nʼelu ugwu.

< 雅歌 2 >