< 詩篇 96 >

1 你們要向耶和華唱新歌! 全地都要向耶和華歌唱!
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.
2 要向耶和華歌唱,稱頌他的名! 天天傳揚他的救恩!
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
3 在列邦中述說他的榮耀! 在萬民中述說他的奇事!
Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4 因耶和華為大,當受極大的讚美; 他在萬神之上,當受敬畏。
Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
5 外邦的神都屬虛無; 惟獨耶和華創造諸天。
Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6 有尊榮和威嚴在他面前; 有能力與華美在他聖所。
Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
7 民中的萬族啊,你們要將榮耀、能力歸給耶和華, 都歸給耶和華!
Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
8 要將耶和華的名所當得的榮耀歸給他, 拿供物來進入他的院宇。
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
9 當以聖潔的妝飾敬拜耶和華; 全地要在他面前戰抖!
Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
10 人在列邦中要說:耶和華作王! 世界就堅定,不得動搖; 他要按公正審判眾民。
Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
11 願天歡喜,願地快樂! 願海和其中所充滿的澎湃!
Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.
12 願田和其中所有的都歡樂! 那時,林中的樹木都要在耶和華面前歡呼。
Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.
13 因為他來了,他來要審判全地。 他要按公義審判世界, 按他的信實審判萬民。
Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

< 詩篇 96 >