< 詩篇 90 >

1 神人摩西的祈禱。 主啊,你世世代代作我們的居所。
Ekpere Mosis, bụ onyeozi Chineke. O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile.
2 諸山未曾生出, 地與世界你未曾造成, 從亙古到永遠,你是上帝。
Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.
3 你使人歸於塵土,說: 你們世人要歸回。
Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
4 在你看來,千年如已過的昨日, 又如夜間的一更。
Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.
5 你叫他們如水沖去; 他們如睡一覺。 早晨,他們如生長的草,
Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
6 早晨發芽生長, 晚上割下枯乾。
ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
7 我們因你的怒氣而消滅, 因你的忿怒而驚惶。
E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
8 你將我們的罪孽擺在你面前, 將我們的隱惡擺在你面光之中。
Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.
9 我們經過的日子都在你震怒之下; 我們度盡的年歲好像一聲歎息。
Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
10 我們一生的年日是七十歲, 若是強壯可到八十歲; 但其中所矜誇的不過是勞苦愁煩, 轉眼成空,我們便如飛而去。
Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.
11 誰曉得你怒氣的權勢? 誰按着你該受的敬畏曉得你的忿怒呢?
Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.
12 求你指教我們怎樣數算自己的日子, 好叫我們得着智慧的心。
Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
13 耶和華啊,我們要等到幾時呢? 求你轉回,為你的僕人後悔。
O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.
14 求你使我們早早飽得你的慈愛, 好叫我們一生一世歡呼喜樂。
Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
15 求你照着你使我們受苦的日子, 和我們遭難的年歲,叫我們喜樂。
Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.
16 願你的作為向你僕人顯現; 願你的榮耀向他們子孫顯明。
Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.
17 願主-我們上帝的榮美歸於我們身上。 願你堅立我們手所做的工; 我們手所做的工,願你堅立。
Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.

< 詩篇 90 >