< 詩篇 61 >

1 大衛的詩,交與伶長。用絲弦的樂器。 上帝啊,求你聽我的呼求, 側耳聽我的禱告!
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ. Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m.
2 我心裏發昏的時候, 我要從地極求告你。 求你領我到那比我更高的磐石!
Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
3 因為你作過我的避難所, 作過我的堅固臺,脫離仇敵。
Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.
4 我要永遠住在你的帳幕裏! 我要投靠在你翅膀下的隱密處! (細拉)
Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. (Sela)
5 上帝啊,你原是聽了我所許的願; 你將產業賜給敬畏你名的人。
Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
6 你要加添王的壽數; 他的年歲必存到世世。
Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
7 他必永遠坐在上帝面前; 願你預備慈愛和誠實保佑他!
Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
8 這樣,我要歌頌你的名,直到永遠, 好天天還我所許的願。
Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

< 詩篇 61 >