< 詩篇 59 >

1 掃羅打發人窺探大衛的房屋,要殺他。那時,大衛作這金詩,交與伶長。調用休要毀壞。 我的上帝啊,求你救我脫離仇敵, 把我安置在高處,得脫那些起來攻擊我的人。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.
2 求你救我脫離作孽的人 和喜愛流人血的人!
Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.
3 因為,他們埋伏要害我的命; 有能力的人聚集來攻擊我。 耶和華啊,這不是為我的過犯, 也不是為我的罪愆。
Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.
4 我雖然無過,他們預備整齊,跑來攻擊我。 求你興起鑒察,幫助我!
Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!
5 萬軍之上帝-耶和華以色列的上帝啊! 求你興起,懲治萬邦! 不要憐憫行詭詐的惡人! (細拉)
Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. (Sela)
6 他們晚上轉回, 叫號如狗,圍城繞行。
Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
7 他們口中噴吐惡言,嘴裏有刀; 他們說:有誰聽見?
Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”
8 但你-耶和華必笑話他們; 你要嗤笑萬邦。
Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo.
9 我的力量啊,我必仰望你, 因為上帝是我的高臺。
O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.
10 我的上帝要以慈愛迎接我; 上帝要叫我看見我仇敵遭報。
Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.
11 不要殺他們,恐怕我的民忘記。 主啊,你是我們的盾牌; 求你用你的能力使他們四散, 且降為卑。
O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala.
12 因他們口中的罪和嘴裏的言語, 並咒罵虛謊的話, 願他們在驕傲之中被纏住了。
Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,
13 求你發怒,使他們消滅, 以致歸於無有, 叫他們知道上帝在雅各中間掌權, 直到地極。 (細拉)
jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.
14 到了晚上,任憑他們轉回; 任憑他們叫號如狗,圍城繞行。
Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
15 他們必走來走去,尋找食物, 若不得飽就終夜在外。
Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.
16 但我要歌頌你的力量, 早晨要高唱你的慈愛; 因為你作過我的高臺, 在我急難的日子作過我的避難所。
Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
17 我的力量啊,我要歌頌你; 因為上帝是我的高臺, 是賜恩與我的上帝。
O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.

< 詩篇 59 >