< 詩篇 19 >

1 大衛的詩,交與伶長。 諸天述說上帝的榮耀; 穹蒼傳揚他的手段。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
2 這日到那日發出言語; 這夜到那夜傳出知識。
Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
3 無言無語, 也無聲音可聽。
Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha.
4 它的量帶通遍天下, 它的言語傳到地極。 上帝在其間為太陽安設帳幕;
Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
5 太陽如同新郎出洞房, 又如勇士歡然奔路。
Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
6 它從天這邊出來,繞到天那邊, 沒有一物被隱藏不得它的熱氣。
Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
7 耶和華的律法全備,能甦醒人心; 耶和華的法度確定,能使愚人有智慧。
Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
8 耶和華的訓詞正直,能快活人的心; 耶和華的命令清潔,能明亮人的眼目。
Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
9 耶和華的道理潔淨,存到永遠; 耶和華的典章真實,全然公義-
Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
10 都比金子可羨慕,且比極多的精金可羨慕; 比蜜甘甜,且比蜂房下滴的蜜甘甜。
Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
11 況且你的僕人因此受警戒, 守着這些便有大賞。
Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
12 誰能知道自己的錯失呢? 願你赦免我隱而未現的過錯。
Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
13 求你攔阻僕人不犯任意妄為的罪, 不容這罪轄制我, 我便完全,免犯大罪。
Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
14 耶和華-我的磐石,我的救贖主啊, 願我口中的言語、心裏的意念在你面前蒙悅納。
Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.

< 詩篇 19 >