< 詩篇 149 >

1 你們要讚美耶和華! 向耶和華唱新歌, 在聖民的會中讚美他!
Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.
2 願以色列因造他的主歡喜! 願錫安的民因他們的王快樂!
Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha.
3 願他們跳舞讚美他的名, 擊鼓彈琴歌頌他!
Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.
4 因為耶和華喜愛他的百姓; 他要用救恩當作謙卑人的妝飾。
Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.
5 願聖民因所得的榮耀高興! 願他們在床上歡呼!
Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.
6 願他們口中稱讚上帝為高, 手裏有兩刃的刀,
Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
7 為要報復列邦, 刑罰萬民。
iji bọọrọ mba niile ọbọ taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,
8 要用鍊子捆他們的君王, 用鐵鐐鎖他們的大臣;
iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,
9 要在他們身上施行所記錄的審判。 他的聖民都有這榮耀。 你們要讚美耶和華!
imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.

< 詩篇 149 >