< 詩篇 143 >

1 大衛的詩。 耶和華啊,求你聽我的禱告, 留心聽我的懇求, 憑你的信實和公義應允我。
Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka.
2 求你不要審問僕人; 因為在你面前,凡活着的人沒有一個是義的。
Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.
3 原來仇敵逼迫我, 將我打倒在地, 使我住在幽暗之處, 像死了許久的人一樣。
Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
4 所以,我的靈在我裏面發昏; 我的心在我裏面悽慘。
Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
5 我追想古時之日, 思想你的一切作為, 默念你手的工作。
Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
6 我向你舉手; 我的心渴想你, 如乾旱之地盼雨一樣。 (細拉)
Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. (Sela)
7 耶和華啊,求你速速應允我! 我心神耗盡! 不要向我掩面, 免得我像那些下坑的人一樣。
O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
8 求你使我清晨得聽你慈愛之言, 因我倚靠你; 求你使我知道當行的路, 因我的心仰望你。
Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
9 耶和華啊,求你救我脫離我的仇敵! 我往你那裏藏身。
O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
10 求你指教我遵行你的旨意, 因你是我的上帝。 你的靈本為善; 求你引我到平坦之地。
Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.
11 耶和華啊,求你為你的名將我救活, 憑你的公義,將我從患難中領出來,
O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
12 憑你的慈愛剪除我的仇敵, 滅絕一切苦待我的人, 因我是你的僕人。
Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.

< 詩篇 143 >