< 詩篇 119 >

1 行為完全、遵行耶和華律法的, 這人便為有福!
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.
2 遵守他的法度、一心尋求他的, 這人便為有福!
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
3 這人不做非義的事, 但遵行他的道。
Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.
4 耶和華啊,你曾將你的訓詞吩咐我們, 為要我們殷勤遵守。
I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.
5 但願我行事堅定, 得以遵守你的律例。
Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!
6 我看重你的一切命令, 就不至於羞愧。
Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.
7 我學了你公義的判語, 就要以正直的心稱謝你。
Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.
8 我必守你的律例; 求你總不要丟棄我!
Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.
9 少年人用甚麼潔淨他的行為呢? 是要遵行你的話!
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
10 我一心尋求了你; 求你不要叫我偏離你的命令。
Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
11 我將你的話藏在心裏, 免得我得罪你。
Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.
12 耶和華啊,你是應當稱頌的! 求你將你的律例教訓我!
Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile.
13 我用嘴唇傳揚你口中的一切典章。
Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.
14 我喜悅你的法度, 如同喜悅一切的財物。
Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
15 我要默想你的訓詞, 看重你的道路。
Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
16 我要在你的律例中自樂; 我不忘記你的話。
Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.
17 求你用厚恩待你的僕人,使我存活, 我就遵守你的話。
Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.
18 求你開我的眼睛, 使我看出你律法中的奇妙。
Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.
19 我是在地上作寄居的; 求你不要向我隱瞞你的命令!
Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.
20 我時常切慕你的典章, 甚至心碎。
Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.
21 受咒詛、偏離你命令的驕傲人, 你已經責備他們。
Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.
22 求你除掉我所受的羞辱和藐視, 因我遵守你的法度。
Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.
23 雖有首領坐着妄論我, 你僕人卻思想你的律例。
Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.
24 你的法度是我所喜樂的, 是我的謀士。
Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m.
25 我的性命幾乎歸於塵土; 求你照你的話將我救活!
Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.
26 我述說我所行的,你應允了我; 求你將你的律例教訓我!
Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.
27 求你使我明白你的訓詞, 我就思想你的奇事。
Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.
28 我的心因愁苦而消化; 求你照你的話使我堅立!
Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
29 求你使我離開奸詐的道, 開恩將你的律法賜給我!
Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.
30 我揀選了忠信的道, 將你的典章擺在我面前。
Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.
31 我持守你的法度; 耶和華啊,求你不要叫我羞愧!
O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.
32 你開廣我心的時候, 我就往你命令的道上直奔。
Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.
33 耶和華啊,求你將你的律例指教我, 我必遵守到底!
O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.
34 求你賜我悟性,我便遵守你的律法, 且要一心遵守。
Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.
35 求你叫我遵行你的命令, 因為這是我所喜樂的。
Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
36 求你使我的心趨向你的法度, 不趨向非義之財。
Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.
37 求你叫我轉眼不看虛假, 又叫我在你的道中生活。
Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.
38 你向敬畏你的人所應許的話, 求你向僕人堅定!
Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.
39 求你使我所怕的羞辱遠離我, 因你的典章本為美。
Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
40 我羨慕你的訓詞; 求你使我在你的公義上生活!
Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.
41 耶和華啊,願你照你的話,使你的慈愛, 就是你的救恩,臨到我身上,
O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;
42 我就有話回答那羞辱我的, 因我倚靠你的話。
mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.
43 求你叫真理的話總不離開我口, 因我仰望你的典章。
Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.
44 我要常守你的律法, 直到永永遠遠。
Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.
45 我要自由而行, 因我素來考究你的訓詞。
Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
46 我也要在君王面前論說你的法度, 並不至於羞愧。
Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,
47 我要在你的命令中自樂; 這命令素來是我所愛的。
nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.
48 我又要遵行你的命令, 這命令素來是我所愛的; 我也要思想你的律例。
Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
49 求你記念向你僕人所應許的話, 叫我有盼望。
Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.
50 這話將我救活了; 我在患難中,因此得安慰。
Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.
51 驕傲的人甚侮慢我, 我卻未曾偏離你的律法。
Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.
52 耶和華啊,我記念你從古以來的典章, 就得了安慰。
O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.
53 我見惡人離棄你的律法, 就怒氣發作,猶如火燒。
Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ.
54 我在世寄居, 素來以你的律例為詩歌。
Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.
55 耶和華啊,我夜間記念你的名, 遵守你的律法。
Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.
56 我所以如此, 是因我守你的訓詞。
Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi.
57 耶和華是我的福分; 我曾說,我要遵守你的言語。
O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.
58 我一心求過你的恩; 願你照你的話憐憫我!
Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.
59 我思想我所行的道, 就轉步歸向你的法度。
Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.
60 我急忙遵守你的命令, 並不遲延。
Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.
61 惡人的繩索纏繞我, 我卻沒有忘記你的律法。
A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.
62 我因你公義的典章, 半夜必起來稱謝你。
Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
63 凡敬畏你、守你訓詞的人, 我都與他作伴。
Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.
64 耶和華啊,你的慈愛遍滿大地; 求你將你的律例教訓我!
O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.
65 耶和華啊,你向來是照你的話善待僕人。
Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.
66 求你將精明和知識賜給我, 因我信了你的命令。
Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.
67 我未受苦以先走迷了路, 現在卻遵守你的話。
Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.
68 你本為善,所行的也善; 求你將你的律例教訓我!
I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.
69 驕傲人編造謊言攻擊我, 我卻要一心守你的訓詞。
Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.
70 他們心蒙脂油, 我卻喜愛你的律法。
Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.
71 我受苦是與我有益, 為要使我學習你的律例。
Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.
72 你口中的訓言與我有益, 勝於千萬的金銀。
Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.
73 你的手製造我,建立我; 求你賜我悟性,可以學習你的命令!
Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.
74 敬畏你的人見我就要歡喜, 因我仰望你的話。
Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.
75 耶和華啊,我知道你的判語是公義的; 你使我受苦是以誠實待我。
O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.
76 求你照着應許僕人的話, 以慈愛安慰我。
Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.
77 願你的慈悲臨到我,使我存活, 因你的律法是我所喜愛的。
Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.
78 願驕傲人蒙羞,因為他們無理地傾覆我; 但我要思想你的訓詞。
Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
79 願敬畏你的人歸向我, 他們就知道你的法度。
Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.
80 願我的心在你的律例上完全, 使我不致蒙羞。
Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.
81 我心渴想你的救恩, 仰望你的應許。
Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.
82 我因盼望你的應許眼睛失明,說: 你何時安慰我?
Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”
83 我好像煙薰的皮袋, 卻不忘記你的律例。
Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.
84 你僕人的年日有多少呢? 你幾時向逼迫我的人施行審判呢?
Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?
85 不從你律法的驕傲人為我掘了坑。
Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.
86 你的命令盡都誠實; 他們無理地逼迫我,求你幫助我!
Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.
87 他們幾乎把我從世上滅絕, 但我沒有離棄你的訓詞。
Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.
88 求你照你的慈愛將我救活, 我就遵守你口中的法度。
Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.
89 耶和華啊,你的話安定在天, 直到永遠。
O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.
90 你的誠實存到萬代; 你堅定了地,地就長存。
Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.
91 天地照你的安排存到今日; 萬物都是你的僕役。
Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.
92 我若不是喜愛你的律法, 早就在苦難中滅絕了!
A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.
93 我永不忘記你的訓詞, 因你用這訓詞將我救活了。
Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.
94 我是屬你的,求你救我, 因我尋求了你的訓詞。
Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
95 惡人等待我,要滅絕我, 我卻要揣摩你的法度。
Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
96 我看萬事盡都有限, 惟有你的命令極其寬廣。
Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.
97 我何等愛慕你的律法, 終日不住地思想。
O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
98 你的命令常存在我心裏, 使我比仇敵有智慧。
Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.
99 我比我的師傅更通達, 因我思想你的法度。
Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.
100 我比年老的更明白, 因我守了你的訓詞。
Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.
101 我禁止我腳走一切的邪路, 為要遵守你的話。
Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi
102 我沒有偏離你的典章, 因為你教訓了我。
Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.
103 你的言語在我上膛何等甘美, 在我口中比蜜更甜!
Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!
104 我藉着你的訓詞得以明白, 所以我恨一切的假道。
A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.
105 你的話是我腳前的燈, 是我路上的光。
Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
106 你公義的典章,我曾起誓遵守, 我必按誓而行。
Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.
107 我甚是受苦; 耶和華啊,求你照你的話將我救活!
Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.
108 耶和華啊,求你悅納我口中的讚美為供物, 又將你的典章教訓我!
O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.
109 我的性命常在危險之中, 我卻不忘記你的律法。
Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.
110 惡人為我設下網羅, 我卻沒有偏離你的訓詞。
Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.
111 我以你的法度為永遠的產業, 因這是我心中所喜愛的。
Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.
112 我的心專向你的律例, 永遠遵行,一直到底。
Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.
113 心懷二意的人為我所恨; 但你的律法為我所愛。
Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
114 你是我藏身之處,又是我的盾牌; 我甚仰望你的話語。
Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.
115 作惡的人哪,你們離開我吧! 我好遵守我上帝的命令。
Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!
116 求你照你的話扶持我,使我存活, 也不叫我因失望而害羞。
Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.
117 求你扶持我,我便得救, 時常看重你的律例。
Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.
118 凡偏離你律例的人,你都輕棄他們, 因為他們的詭詐必歸虛空。
Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.
119 凡地上的惡人,你除掉他,好像除掉渣滓; 因此我愛你的法度。
Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.
120 我因懼怕你,肉就發抖; 我也怕你的判語。
Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.
121 我行過公平和公義, 求你不要撇下我給欺壓我的人!
Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
122 求你為僕人作保,使我得好處, 不容驕傲人欺壓我!
Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.
123 我因盼望你的救恩 和你公義的話眼睛失明。
Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.
124 求你照你的慈愛待僕人, 將你的律例教訓我。
Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.
125 我是你的僕人,求你賜我悟性, 使我得知你的法度。
Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.
126 這是耶和華降罰的時候, 因人廢了你的律法。
O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị.
127 所以,我愛你的命令勝於金子, 更勝於精金。
Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
128 你一切的訓詞,在萬事上我都以為正直; 我卻恨惡一切假道。
nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.
129 你的法度奇妙, 所以我一心謹守。
Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.
130 你的言語一解開就發出亮光, 使愚人通達。
Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
131 我張口而氣喘, 因我切慕你的命令。
Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.
132 求你轉向我,憐憫我, 好像你素常待那些愛你名的人。
Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
133 求你用你的話使我腳步穩當, 不許甚麼罪孽轄制我。
Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.
134 求你救我脫離人的欺壓, 我要遵守你的訓詞。
Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.
135 求你用臉光照僕人, 又將你的律例教訓我。
Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
136 我的眼淚下流成河, 因為他們不守你的律法。
Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.
137 耶和華啊,你是公義的; 你的判語也是正直的!
O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.
138 你所命定的法度是憑公義和至誠。
Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.
139 我心焦急,如同火燒, 因我敵人忘記你的言語。
Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
140 你的話極其精煉, 所以你的僕人喜愛。
Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
141 我微小,被人藐視, 卻不忘記你的訓詞。
Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.
142 你的公義永遠長存; 你的律法盡都真實。
Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
143 我遭遇患難愁苦, 你的命令卻是我所喜愛的。
Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
144 你的法度永遠是公義的; 求你賜我悟性,我就活了。
Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
145 耶和華啊,我一心呼籲你; 求你應允我,我必謹守你的律例!
Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
146 我向你呼籲,求你救我! 我要遵守你的法度。
Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.
147 我趁天未亮呼求; 我仰望了你的言語。
Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.
148 我趁夜更未換將眼睜開, 為要思想你的話語。
Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
149 求你照你的慈愛聽我的聲音; 耶和華啊,求你照你的典章將我救活!
Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.
150 追求奸惡的人臨近了; 他們遠離你的律法。
Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
151 耶和華啊,你與我相近; 你一切的命令盡都真實!
Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
152 我因學你的法度, 久已知道是你永遠立定的。
Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
153 求你看顧我的苦難,搭救我, 因我不忘記你的律法。
Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.
154 求你為我辨屈,救贖我, 照你的話將我救活。
Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
155 救恩遠離惡人, 因為他們不尋求你的律例。
Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
156 耶和華啊,你的慈悲本為大; 求你照你的典章將我救活。
O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
157 逼迫我的,抵擋我的,很多, 我卻沒有偏離你的法度。
Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
158 我看見奸惡的人就甚憎惡, 因為他們不遵守你的話。
Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
159 你看我怎樣愛你的訓詞! 耶和華啊,求你照你的慈愛將我救活!
Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.
160 你話的總綱是真實; 你一切公義的典章是永遠長存。
Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
161 首領無故地逼迫我, 但我的心畏懼你的言語。
Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.
162 我喜愛你的話, 好像人得了許多擄物。
Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
163 謊話是我所恨惡所憎嫌的; 惟你的律法是我所愛的。
Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
164 我因你公義的典章一天七次讚美你。
Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.
165 愛你律法的人有大平安, 甚麼都不能使他們絆腳。
Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.
166 耶和華啊,我仰望了你的救恩, 遵行了你的命令。
Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.
167 我心裏守了你的法度; 這法度我甚喜愛。
Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.
168 我遵守了你的訓詞和法度, 因我一切所行的都在你面前。
Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile.
169 耶和華啊,願我的呼籲達到你面前, 照你的話賜我悟性。
Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.
170 願我的懇求達到你面前, 照你的話搭救我。
Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.
171 願我的嘴發出讚美的話, 因為你將律例教訓我。
Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.
172 願我的舌頭歌唱你的話, 因你一切的命令盡都公義。
Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.
173 願你用手幫助我, 因我揀選了你的訓詞。
Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.
174 耶和華啊,我切慕你的救恩! 你的律法也是我所喜愛的。
Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m.
175 願我的性命存活,得以讚美你! 願你的典章幫助我!
Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.
176 我如亡羊走迷了路,求你尋找僕人, 因我不忘記你的命令。
Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

< 詩篇 119 >