< 詩篇 115 >

1 耶和華啊,榮耀不要歸與我們, 不要歸與我們; 要因你的慈愛和誠實歸在你的名下!
Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
2 為何容外邦人說: 他們的上帝在哪裏呢?
Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
3 然而,我們的上帝在天上, 都隨自己的意旨行事。
Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
4 他們的偶像是金的,銀的, 是人手所造的,
Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
5 有口卻不能言, 有眼卻不能看,
Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
6 有耳卻不能聽, 有鼻卻不能聞,
ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
7 有手卻不能摸, 有腳卻不能走, 有喉嚨也不能出聲。
ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
8 造他的要和他一樣; 凡靠他的也要如此。
Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
9 以色列啊,你要倚靠耶和華! 他是你的幫助和你的盾牌。
Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
10 亞倫家啊,你們要倚靠耶和華! 他是你們的幫助和你們的盾牌。
Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11 你們敬畏耶和華的,要倚靠耶和華! 他是你們的幫助和你們的盾牌。
Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
12 耶和華向來眷念我們; 他還要賜福給我們: 要賜福給以色列的家, 賜福給亞倫的家。
Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
13 凡敬畏耶和華的,無論大小, 主必賜福給他。
ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
14 願耶和華叫你們 和你們的子孫日見加增。
Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.
15 你們蒙了造天地之耶和華的福!
Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa gọzie unu.
16 天,是耶和華的天; 地,他卻給了世人。
Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
17 死人不能讚美耶和華; 下到寂靜中的也都不能。
Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
18 但我們要稱頌耶和華, 從今時直到永遠。 你們要讚美耶和華!
ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị.

< 詩篇 115 >