< 箴言 14 >

1 智慧婦人建立家室; 愚妄婦人親手拆毀。
Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.
2 行動正直的,敬畏耶和華; 行事乖僻的,卻藐視他。
Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.
3 愚妄人口中驕傲,如杖責打己身; 智慧人的嘴必保守自己。
Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.
4 家裏無牛,槽頭乾淨; 土產加多乃憑牛力。
Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.
5 誠實見證人不說謊話; 假見證人吐出謊言。
Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.
6 褻慢人尋智慧,卻尋不着; 聰明人易得知識。
Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.
7 到愚昧人面前, 不見他嘴中有知識。
Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.
8 通達人的智慧在乎明白己道; 愚昧人的愚妄乃是詭詐。
Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.
9 愚妄人犯罪,以為戲耍; 正直人互相喜悅。
Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.
10 心中的苦楚,自己知道; 心裏的喜樂,外人無干。
Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.
11 奸惡人的房屋必傾倒; 正直人的帳棚必興盛。
A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.
12 有一條路,人以為正, 至終成為死亡之路。
Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
13 人在喜笑中,心也憂愁; 快樂至極就生愁苦。
Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
14 心中背道的,必滿得自己的結果; 善人必從自己的行為得以知足。
Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.
15 愚蒙人是話都信; 通達人步步謹慎。
Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.
16 智慧人懼怕,就遠離惡事; 愚妄人卻狂傲自恃。
Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
17 輕易發怒的,行事愚妄; 設立詭計的,被人恨惡。
Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.
18 愚蒙人得愚昧為產業; 通達人得知識為冠冕。
Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.
19 壞人俯伏在善人面前; 惡人俯伏在義人門口。
Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.
20 貧窮人連鄰舍也恨他; 富足人朋友最多。
Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.
21 藐視鄰舍的,這人有罪; 憐憫貧窮的,這人有福。
Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.
22 謀惡的,豈非走入迷途嗎? 謀善的,必得慈愛和誠實。
Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
23 諸般勤勞都有益處; 嘴上多言乃致窮乏。
Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.
24 智慧人的財為自己的冠冕; 愚妄人的愚昧終是愚昧。
Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.
25 作真見證的,救人性命; 吐出謊言的,施行詭詐。
Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.
26 敬畏耶和華的,大有倚靠; 他的兒女也有避難所。
Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.
27 敬畏耶和華就是生命的泉源, 可以使人離開死亡的網羅。
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
28 帝王榮耀在乎民多; 君王衰敗在乎民少。
Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.
29 不輕易發怒的,大有聰明; 性情暴躁的,大顯愚妄。
Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
30 心中安靜是肉體的生命; 嫉妒是骨中的朽爛。
Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure.
31 欺壓貧寒的,是辱沒造他的主; 憐憫窮乏的,乃是尊敬主。
Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.
32 惡人在所行的惡上必被推倒; 義人臨死,有所投靠。
Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.
33 智慧存在聰明人心中; 愚昧人心裏所存的,顯而易見。
Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.
34 公義使邦國高舉; 罪惡是人民的羞辱。
Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.
35 智慧的臣子蒙王恩惠; 貽羞的僕人遭其震怒。
Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

< 箴言 14 >