< 箴言 11 >

1 詭詐的天平為耶和華所憎惡; 公平的法碼為他所喜悅。
Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
2 驕傲來,羞恥也來; 謙遜人卻有智慧。
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
3 正直人的純正必引導自己; 奸詐人的乖僻必毀滅自己。
Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
4 發怒的日子資財無益; 惟有公義能救人脫離死亡。
Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
5 完全人的義必指引他的路; 但惡人必因自己的惡跌倒。
Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
6 正直人的義必拯救自己; 奸詐人必陷在自己的罪孽中。
Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
7 惡人一死,他的指望必滅絕; 罪人的盼望也必滅沒。
Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
8 義人得脫離患難, 有惡人來代替他。
Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
9 不虔敬的人用口敗壞鄰舍; 義人卻因知識得救。
Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
10 義人享福,合城喜樂; 惡人滅亡,人都歡呼。
Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
11 城因正直人祝福便高舉, 卻因邪惡人的口就傾覆。
A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
12 藐視鄰舍的,毫無智慧; 明哲人卻靜默不言。
Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
13 往來傳舌的,洩漏密事; 心中誠實的,遮隱事情。
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
14 無智謀,民就敗落; 謀士多,人便安居。
Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
15 為外人作保的,必受虧損; 恨惡擊掌的,卻得安穩。
Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
16 恩德的婦女得尊榮; 強暴的男子得資財。
Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
17 仁慈的人善待自己; 殘忍的人擾害己身。
Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
18 惡人經營,得虛浮的工價; 撒義種的,得實在的果效。
Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
19 恆心為義的,必得生命; 追求邪惡的,必致死亡。
Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
20 心中乖僻的,為耶和華所憎惡; 行事完全的,為他所喜悅。
Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
21 惡人雖然連手,必不免受罰; 義人的後裔必得拯救。
Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
22 婦女美貌而無見識, 如同金環帶在豬鼻上。
Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
23 義人的心願盡得好處; 惡人的指望致干忿怒。
Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
24 有施散的,卻更增添; 有吝惜過度的,反致窮乏。
Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
25 好施捨的,必得豐裕; 滋潤人的,必得滋潤。
E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
26 屯糧不賣的,民必咒詛他; 情願出賣的,人必為他祝福。
Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
27 懇切求善的,就求得恩惠; 惟獨求惡的,惡必臨到他身。
Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
28 倚仗自己財物的,必跌倒; 義人必發旺,如青葉。
Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
29 擾害己家的,必承受清風; 愚昧人必作慧心人的僕人。
Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
30 義人所結的果子就是生命樹; 有智慧的,必能得人。
Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
31 看哪,義人在世尚且受報, 何況惡人和罪人呢?
Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.

< 箴言 11 >