< 民數記 17 >

1 耶和華對摩西說:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 「你曉諭以色列人,從他們手下取杖,每支派一根;從他們所有的首領,按着支派,共取十二根。你要將各人的名字寫在各人的杖上,
“Gwa ụmụ Izrel okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya.
3 並要將亞倫的名字寫在利未的杖上,因為各族長必有一根杖。
Ma nʼelu mkpanaka Livayị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla.
4 你要把這些杖存在會幕內法櫃前,就是我與你們相會之處。
Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị.
5 後來我所揀選的那人,他的杖必發芽。這樣,我必使以色列人向你們所發的怨言止息,不再達到我耳中。」
Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị Izrel site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu.”
6 於是摩西曉諭以色列人,他們的首領就把杖交給他,按着支派,每首領一根,共有十二根;亞倫的杖也在其中。
Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha.
7 摩西就把杖存在法櫃的帳幕內,在耶和華面前。
Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu Onyenwe anyị nʼime ime ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.
8 第二天,摩西進法櫃的帳幕去。誰知利未族亞倫的杖已經發了芽,生了花苞,開了花,結了熟杏。
Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd.
9 摩西就把所有的杖從耶和華面前拿出來,給以色列眾人看;他們看見了,各首領就把自己的杖拿去。
Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya.
10 耶和華吩咐摩西說:「把亞倫的杖還放在法櫃前,給這些背叛之子留作記號。這樣,你就使他們向我發的怨言止息,免得他們死亡。」
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.”
11 摩西就這樣行。耶和華怎樣吩咐他,他就怎樣行了。
Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
12 以色列人對摩西說:「我們死啦!我們滅亡啦!都滅亡啦!
Ma ndị Izrel zara Mosis sị ya, “Ndị nwụrụ anwụ ka anyị bụ! Ofufu ka anyị furu. Nʼezie anyị bụ ndị furu efu.
13 凡挨近耶和華帳幕的是必死的。我們都要死亡嗎?」
Onye ọbụla bịaruru nso ebe obibi Onyenwe anyị ga-anwụ. Anyị niile ga-anwụ?”

< 民數記 17 >