< 彌迦書 1 >

1 當猶大王約坦、亞哈斯、希西家在位的時候,摩利沙人彌迦得耶和華的默示,論撒馬利亞和耶路撒冷。
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.
2 萬民哪,你們都要聽! 地和其上所有的,也都要側耳而聽! 主耶和華從他的聖殿 要見證你們的不是。
Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
3 看哪,耶和華出了他的居所, 降臨步行地的高處。
Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.
4 眾山在他以下必消化, 諸谷必崩裂, 如蠟化在火中, 如水沖下山坡。
Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
5 這都因雅各的罪過, 以色列家的罪惡。 雅各的罪過在哪裏呢? 豈不是在撒馬利亞嗎? 猶大的邱壇在哪裏呢? 豈不是在耶路撒冷嗎?
Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?
6 所以我必使撒馬利亞變為田野的亂堆, 又作為種葡萄之處; 也必將她的石頭倒在谷中, 露出根基來。
“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị. Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
7 她一切雕刻的偶像必被打碎; 她所得的財物必被火燒; 所有的偶像我必毀滅; 因為是從妓女雇價所聚來的, 後必歸為妓女的雇價。
Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”
8 先知說:因此我必大聲哀號, 赤腳露體而行; 又要呼號如野狗, 哀鳴如鴕鳥。
Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
9 因為撒馬利亞的傷痕無法醫治, 延及猶大和耶路撒冷我民的城門。
Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.
10 不要在迦特報告這事, 總不要哭泣; 我在伯‧亞弗拉滾於灰塵之中。
Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.
11 沙斐的居民哪,你們要赤身蒙羞過去。 撒南的居民不敢出來。 伯‧以薛人的哀哭使你們無處可站。
Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
12 瑪律的居民心甚憂急,切望得好處, 因為災禍從耶和華那裏臨到耶路撒冷的城門。
Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
13 拉吉的居民哪,要用快馬套車; 錫安民的罪由你而起; 以色列人的罪過在你那裏顯出。
Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
14 猶大啊,你要將禮物送給摩利設‧迦特。 亞革悉的眾族必用詭詐待以色列諸王。
Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
15 瑪利沙的居民哪, 我必使那奪取你的來到你這裏; 以色列的尊貴人必到亞杜蘭。
Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.
16 猶大啊,要為你所喜愛的兒女剪除你的頭髮, 使頭光禿,要大大地光禿,如同禿鷹, 因為他們都被擄去離開你。
Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.

< 彌迦書 1 >