< 約珥書 3 >

1 「到那日,我使猶大和耶路撒冷被擄之人歸回的時候,
“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
2 我要聚集萬民,帶他們下到約沙法谷,在那裏施行審判;因為他們將我的百姓,就是我的產業以色列,分散在列國中,又分取我的地土,
na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
3 且為我的百姓拈鬮,將童子換妓女,賣童女買酒喝。
Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
4 「泰爾、西頓,和非利士四境的人哪,你們與我何干?你們要報復我嗎?若報復我,我必使報應速速歸到你們的頭上。
“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
5 你們既然奪取我的金銀,又將我可愛的寶物帶入你們宮殿,
Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
6 並將猶大人和耶路撒冷人賣給希臘人,使他們遠離自己的境界。
Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
7 我必激動他們離開你們所賣到之地,又必使報應歸到你們的頭上。
“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
8 我必將你們的兒女賣在猶大人的手中,他們必賣給遠方示巴國的人。這是耶和華說的。」
Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
9 當在萬民中宣告說: 要預備打仗; 激動勇士, 使一切戰士上前來。
Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
10 要將誆頭打成刀劍, 將鐮刀打成戈矛; 軟弱的要說:我有勇力。
Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
11 四圍的列國啊, 你們要速速地來, 一同聚集。 耶和華啊, 求你使你的大能者降臨。
Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
12 萬民都當興起, 上到約沙法谷; 因為我必坐在那裏, 審判四圍的列國。
“Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
13 開鐮吧!因為莊稼熟了; 踐踏吧!因為酒醡滿了。 酒池盈溢; 他們的罪惡甚大。
Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
14 許多許多的人在斷定谷, 因為耶和華的日子臨近斷定谷。
Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
15 日月昏暗, 星宿無光。
Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.
16 耶和華必從錫安吼叫, 從耶路撒冷發聲, 天地就震動。 耶和華卻要作他百姓的避難所, 作以色列人的保障。
Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
17 你們就知道我是耶和華-你們的上帝, 且又住在錫安-我的聖山。 那時,耶路撒冷必成為聖; 外邦人不再從其中經過。
“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
18 到那日,大山要滴甜酒; 小山要流奶子; 猶大溪河都有水流。 必有泉源從耶和華的殿中流出來, 滋潤什亭谷。
“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
19 埃及必然荒涼, 以東變為悽涼的曠野, 都因向猶大人所行的強暴, 又因在本地流無辜人的血。
Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
20 但猶大必存到永遠; 耶路撒冷必存到萬代。
Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
21 我未曾報復流血的罪, 現在我要報復, 因為耶和華住在錫安。
Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.

< 約珥書 3 >