< 約伯記 27 >

1 約伯接着說:
Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2 上帝奪去我的理,全能者使我心中愁苦。 我指着永生的上帝起誓:
“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
3 我的生命尚在我裏面; 上帝所賜呼吸之氣仍在我的鼻孔內。
Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
4 我的嘴決不說非義之言; 我的舌也不說詭詐之語。
egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
5 我斷不以你們為是; 我至死必不以自己為不正!
Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
6 我持定我的義,必不放鬆; 在世的日子,我心必不責備我。
Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
7 願我的仇敵如惡人一樣; 願那起來攻擊我的,如不義之人一般。
“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
8 不敬虔的人雖然得利, 上帝奪取其命的時候還有甚麼指望呢?
Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
9 患難臨到他, 上帝豈能聽他的呼求?
Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
10 他豈以全能者為樂, 隨時求告上帝呢?
Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
11 上帝的作為,我要指教你們; 全能者所行的,我也不隱瞞。
“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
12 你們自己也都見過, 為何全然變為虛妄呢?
Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
13 上帝為惡人所定的分, 強暴人從全能者所得的報乃是這樣:
“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
14 倘或他的兒女增多,還是被刀所殺; 他的子孫必不得飽食。
Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
15 他所遺留的人必死而埋葬; 他的寡婦也不哀哭。
Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
16 他雖積蓄銀子如塵沙, 預備衣服如泥土;
Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
17 他只管預備,義人卻要穿上; 他的銀子,無辜的人要分取。
ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
18 他建造房屋如蟲做窩, 又如守望者所搭的棚。
Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
19 他雖富足躺臥,卻不得收殮, 轉眼之間就不在了。
Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
20 驚恐如波濤將他追上; 暴風在夜間將他颳去。
Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
21 東風把他飄去, 又颳他離開本處。
Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
22 上帝要向他射箭,並不留情; 他恨不得逃脫上帝的手。
Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
23 人要向他拍掌, 並要發叱聲,使他離開本處。
Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”

< 約伯記 27 >