< 耶利米書 3 >

1 有話說:人若休妻, 妻離他而去,作了別人的妻, 前夫豈能再收回她來? 若收回她來,那地豈不是大大玷污了嗎? 但你和許多親愛的行邪淫, 還可以歸向我。 這是耶和華說的。
“Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.
2 你向淨光的高處舉目觀看, 你在何處沒有淫行呢? 你坐在道旁等候, 好像阿拉伯人在曠野埋伏一樣, 並且你的淫行邪惡玷污了全地。
“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.
3 因此甘霖停止, 春雨不降。 你還是有娼妓之臉, 不顧羞恥。
Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.
4 從今以後,你豈不向我呼叫說: 我父啊,你是我幼年的恩主。
Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
5 耶和華豈永遠懷怒,存留到底嗎? 看哪,你又發惡言又行壞事, 隨自己的私意而行。」
Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”
6 約西亞王在位的時候,耶和華又對我說:「背道的以色列所行的,你看見沒有?她上各高山,在各青翠樹下行淫。
Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.
7 她行這些事以後,我說她必歸向我,她卻不歸向我。她奸詐的妹妹猶大也看見了。
Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya.
8 背道的以色列行淫,我為這緣故給她休書休她;我看見她奸詐的妹妹猶大,還不懼怕,也去行淫。
Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.
9 因以色列輕忽了她的淫亂,和石頭木頭行淫,地就被玷污了。
Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi.
10 雖有這一切的事,她奸詐的妹妹猶大還不一心歸向我,不過是假意歸我。這是耶和華說的。」
Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
11 耶和華對我說:「背道的以色列比奸詐的猶大還顯為義。
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
12 你去向北方宣告說: 耶和華說:背道的以色列啊,回來吧! 我必不怒目看你們; 因為我是慈愛的, 我必不永遠存怒。 這是耶和華說的。
Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
13 只要承認你的罪孽, 就是你違背耶和華-你的上帝, 在各青翠樹下向別神東奔西跑, 沒有聽從我的話。 這是耶和華說的。
Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
14 耶和華說:背道的兒女啊,回來吧! 因為我作你們的丈夫, 並且我必將你們從一城取一人, 從一族取兩人,帶到錫安。
“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
15 我也必將合我心的牧者賜給你們。他們必以知識和智慧牧養你們。」
Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.
16 耶和華說:「你們在國中生養眾多;當那些日子,人必不再提說耶和華的約櫃,不追想,不記念,不覺缺少,也不再製造。
Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ,” otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ.
17 那時,人必稱耶路撒冷為耶和華的寶座;萬國必到耶路撒冷,在耶和華立名的地方聚集。他們必不再隨從自己頑梗的惡心行事。
Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.
18 當那些日子,猶大家要和以色列家同行,從北方之地一同來到我賜給你們列祖為業之地。」
Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”
19 我說:我怎樣將你安置在兒女之中, 賜給你美地, 就是萬國中肥美的產業。 我又說:你們必稱我為父, 也不再轉去不跟從我。
“Mụ onwe m kwuru sị, “‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.
20 以色列家,你們向我行詭詐, 真像妻子行詭詐離開她丈夫一樣。 這是耶和華說的。
Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
21 在淨光的高處聽見人聲, 就是以色列人哭泣懇求之聲, 乃因他們走彎曲之道, 忘記耶和華-他們的上帝。
A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu. Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie; ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.
22 你們這背道的兒女啊,回來吧! 我要醫治你們背道的病。 看哪,我們來到你這裏, 因你是耶和華-我們的上帝。
“Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ. Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu.” Ma unu na-aza sị, “E, anyị na-alọghachikwute gị nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.
23 仰望從小山或從大山的喧嚷中得幫助, 真是枉然的。 以色列得救,誠然在乎耶和華-我們的上帝。
Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.
24 從我們幼年以來,那可恥的偶像將我們列祖所勞碌得來的羊群、牛群,和他們的兒女都吞吃了。
Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.
25 我們在羞恥中躺臥吧!願慚愧將我們遮蓋;因為從立國以來,我們和我們的列祖常常得罪耶和華-我們的上帝,沒有聽從耶和華-我們上帝的話。
Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”

< 耶利米書 3 >