< 耶利米書 15 >

1 耶和華對我說:「雖有摩西和撒母耳站在我面前代求,我的心也不顧惜這百姓。你將他們從我眼前趕出,叫他們去吧!
Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.
2 他們問你說:『我們往哪裏去呢?』你便告訴他們,耶和華如此說: 定為死亡的,必致死亡; 定為刀殺的,必交刀殺; 定為饑荒的,必遭饑荒; 定為擄掠的,必被擄掠。」
Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
3 耶和華說:「我命定四樣害他們,就是刀劍殺戮、狗類撕裂、空中的飛鳥,和地上的野獸吞吃毀滅;
“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4 又必使他們在天下萬國中拋來拋去,都因猶大王希西家的兒子瑪拿西在耶路撒冷所行的事。」
Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
5 耶路撒冷啊,誰可憐你呢? 誰為你悲傷呢? 誰轉身問你的安呢?
“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
6 耶和華說:你棄絕了我, 轉身退後; 因此我伸手攻擊你,毀壞你。 我後悔甚不耐煩。
Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
7 我在境內各城門口, 用簸箕簸了我的百姓, 使他們喪掉兒女。 我毀滅他們, 他們仍不轉離所行的道。
Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
8 他們的寡婦在我面前比海沙更多; 我使滅命的午間來, 攻擊少年人的母親, 使痛苦驚嚇忽然臨到她身上。
Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.
9 生過七子的婦人力衰氣絕; 尚在白晝,日頭忽落; 她抱愧蒙羞。 其餘的人, 我必在他們敵人跟前,交與刀劍。 這是耶和華說的。
Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
10 我的母親哪,我有禍了!因你生我作為遍地相爭相競的人。我素來沒有借貸與人,人也沒有借貸與我,人人卻都咒罵我。
Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.
11 耶和華說:「我必要堅固你,使你得好處。災禍苦難臨到的時候,我必要使仇敵央求你。(
Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
12 人豈能將銅與鐵,就是北方的鐵折斷呢?)
“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
13 「我必因你在四境之內所犯的一切罪,把你的貨物財寶當掠物,白白地交給仇敵。
“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.
14 我也必使仇敵帶這掠物到你所不認識的地去,因我怒中起的火要將你們焚燒。」
Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”
15 耶和華啊,你是知道的; 求你記念我,眷顧我, 向逼迫我的人為我報仇; 不要向他們忍怒取我的命, 要知道我為你的緣故受了凌辱。
Ị maara O Onyenwe anyị, ya mere cheta m, lekọtaakwa m. Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m. Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi. Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.
16 耶和華-萬軍之上帝啊, 我得着你的言語就當食物吃了; 你的言語是我心中的歡喜快樂, 因我是稱為你名下的人。
Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri. Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ, nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
17 我沒有坐在宴樂人的會中, 也沒有歡樂; 我因你的感動獨自靜坐, 因你使我滿心憤恨。
O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
18 我的痛苦為何長久不止呢? 我的傷痕為何無法醫治、不能痊癒呢? 難道你待我有詭詐,像流乾的河道嗎?
Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
19 耶和華如此說:你若歸回, 我就將你再帶來, 使你站在我面前; 你若將寶貴的和下賤的分別出來, 你就可以當作我的口。 他們必歸向你, 你卻不可歸向他們。
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị, ime ka i guzokwa nʼihu m. Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m. Ndị a ga-alaghachikwute gị ma i gaghị alaghachikwuru ha.
20 我必使你向這百姓成為堅固的銅牆; 他們必攻擊你,卻不能勝你; 因我與你同在,要拯救你,搭救你。 這是耶和華說的。
Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ. Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo. Ha ga-ebuso gị agha, ma ha agaghị emeri gị nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị, nakwa ịzọpụta gị,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
21 我必搭救你脫離惡人的手, 救贖你脫離強暴人的手。
“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”

< 耶利米書 15 >