< 以賽亞書 6 >

1 當烏西雅王崩的那年,我見主坐在高高的寶座上。他的衣裳垂下,遮滿聖殿。
Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.
2 其上有撒拉弗侍立,各有六個翅膀:用兩個翅膀遮臉,兩個翅膀遮腳,兩個翅膀飛翔;
Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị.
3 彼此呼喊說: 聖哉!聖哉!聖哉!萬軍之耶和華; 他的榮光充滿全地!
Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.”
4 因呼喊者的聲音,門檻的根基震動,殿充滿了煙雲。
Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ.
5 那時我說:「禍哉!我滅亡了!因為我是嘴唇不潔的人,又住在嘴唇不潔的民中,又因我眼見大君王-萬軍之耶和華。」
Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”
6 有一撒拉弗飛到我跟前,手裏拿着紅炭,是用火剪從壇上取下來的,
Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.
7 將炭沾我的口,說:「看哪,這炭沾了你的嘴,你的罪孽便除掉,你的罪惡就赦免了。」
O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”
8 我又聽見主的聲音說:「我可以差遣誰呢?誰肯為我們去呢?」我說:「我在這裏,請差遣我!」
Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.”
9 他說:「你去告訴這百姓說: 你們聽是要聽見,卻不明白; 看是要看見,卻不曉得。
Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’
10 要使這百姓心蒙脂油, 耳朵發沉, 眼睛昏迷; 恐怕眼睛看見, 耳朵聽見, 心裏明白, 回轉過來,便得醫治。」
Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”
11 我就說:「主啊,這到幾時為止呢?」他說: 直到城邑荒涼,無人居住, 房屋空閒無人,地土極其荒涼。
Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile.
12 並且耶和華將人遷到遠方, 在這境內撇下的地土很多。
Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya, ala niile atọgbọkwara nʼefu.
13 境內剩下的人若還有十分之一, 也必被吞滅, 像栗樹、橡樹雖被砍伐, 樹触子卻仍存留。 這聖潔的種類在國中也是如此。
Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a, a ga-eme ka ọ laa nʼiyi. Ma dịka osisi terebint na osisi ook na-ahapụ ogwe mgbe e gbujiri ha, ya mere mkpụrụ nsọ ahụ ga-abụ ogwe osisi nʼala ahụ.”

< 以賽亞書 6 >