< 以賽亞書 52 >

1 錫安哪,興起!興起! 披上你的能力! 聖城耶路撒冷啊,穿上你華美的衣服! 因為從今以後, 未受割禮、不潔淨的必不再進入你中間。
Teta, teta gị Zayọn, yikwasị onwe gị ike dịka uwe! Yikwasị onwe gị uwe mara mma, gị Jerusalem, obodo dị nsọ. Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụ agaghị abata nʼime gị ọzọ.
2 耶路撒冷啊,要抖下塵土! 起來坐在位上! 錫安被擄的居民哪, 要解開你頸項的鎖鍊!
Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.
3 耶和華如此說:「你們是無價被賣的,也必無銀被贖。
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla, ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”
4 主耶和華如此說:起先我的百姓下到埃及,在那裏寄居,又有亞述人無故欺壓他們。
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri, ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.
5 耶和華說:我的百姓既是無價被擄去,如今我在這裏做甚麼呢?耶和華說:轄制他們的人呼叫,我的名整天受褻瀆。
“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile.
6 所以,我的百姓必知道我的名;到那日他們必知道說這話的就是我。看哪,是我!」
Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m; nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụ na ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme. E, ọ bụ mụ onwe m.”
7 那報佳音,傳平安, 報好信,傳救恩的, 對錫安說:你的上帝作王了! 這人的腳登山何等佳美!
Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!”
8 聽啊,你守望之人的聲音, 他們揚起聲來,一同歌唱; 因為耶和華歸回錫安的時候, 他們必親眼看見。
Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.
9 耶路撒冷的荒場啊, 要發起歡聲,一同歌唱; 因為耶和華安慰了他的百姓, 救贖了耶路撒冷。
Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem.
10 耶和華在萬國眼前露出聖臂; 地極的人都看見我們上帝的救恩了。
Onyenwe anyị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị.
11 你們離開吧!離開吧! 從巴比倫出來。 不要沾不潔淨的物; 要從其中出來。 你們扛抬耶和華器皿的人哪, 務要自潔。
Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.
12 你們出來必不致急忙, 也不致奔逃。 因為,耶和華必在你們前頭行; 以色列的上帝必作你們的後盾。
Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.
13 我的僕人行事必有智慧, 必被高舉上升, 且成為至高。
Lee, ohu m ga-enwe uche, a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.
14 許多人因他驚奇; 他的面貌比別人憔悴; 他的形容比世人枯槁。
Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ; otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ, anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
15 這樣,他必洗淨許多國民; 君王要向他閉口。 因所未曾傳與他們的,他們必看見; 未曾聽見的,他們要明白。
Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya, ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ, ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.

< 以賽亞書 52 >