< 以賽亞書 47 >

1 巴比倫的處女啊, 下來坐在塵埃; 迦勒底的閨女啊, 沒有寶座,要坐在地上; 因為你不再稱為柔弱嬌嫩的。
“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.
2 要用磨磨麵, 揭去帕子, 脫去長衣,露腿詵河。
Were nkume igwe nri gwee ọka, wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị. Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.
3 你的下體必被露出; 你的醜陋必被看見。 我要報仇, 誰也不寬容。
A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”
4 我們救贖主的名是 萬軍之耶和華-以色列的聖者。
Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.
5 迦勒底的閨女啊, 你要默然靜坐,進入暗中, 因為你不再稱為列國的主母。
“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.
6 我向我的百姓發怒, 使我的產業被褻瀆, 將他們交在你手中, 你毫不憐憫他們, 把極重的軛加在老年人身上。
Ewesoro m ndị m iwe, mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ. Eweere m ha tinye gị nʼaka, ma i gosighị ha obi ebere. Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti ha ka ị bokwasịrị ibu arọ.
7 你自己說:我必永為主母, 所以你不將這事放在心上, 也不思想這事的結局。
I kwuru sị, ‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’ Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a, ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.
8 你這專好宴樂、安然居住的, 現在當聽這話。 你心中說:惟有我, 除我以外再沒有別的。 我必不致寡居, 也不遭喪子之事。
“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ. Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo, na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa. O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’
9 哪知,喪子、寡居這兩件事 在一日轉眼之間必臨到你; 正在你多行邪術、廣施符咒的時候, 這兩件事必全然臨到你身上。
Ma lee anya! Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gị na mberede. Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa. Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile, agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.
10 你素來倚仗自己的惡行,說: 無人看見我。 你的智慧聰明使你偏邪, 並且你心裏說:惟有我, 除我以外再沒有別的。
Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gị ị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’ Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị, mgbe ị na-asị onwe gị, ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’
11 因此,禍患要臨到你身; 你不知何時發現, 災害落在你身上, 你也不能除掉; 所不知道的毀滅也必忽然臨到你身。
Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị, ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya. Oke mbibi ga-adakwasị gị nke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị; Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya ya ga-abịakwasị gị na mberede.
12 站起來吧! 用你從幼年勞神施行的符咒和你許多的邪術; 或者可得益處, 或者可得強勝。
“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile, na ihe mgbaasị gị niile. Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu. Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.
13 你籌劃太多,以致疲倦。 讓那些觀天象的,看星宿的, 在月朔說預言的,都站起來, 救你脫離所要臨到你的事。
Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka. Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso. Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ. Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.
14 他們要像碎詡被火焚燒, 不能救自己脫離火焰之力; 這火並非可烤的炭火, 也不是可以坐在其前的火。
Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. Ọkụ ga-erechapụkwa ha. Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe ha site nʼọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye, nke a na-anya nʼoge oyi.
15 你所勞神的事都要這樣與你無益; 從幼年與你貿易的也都各奔各鄉,無人救你。
Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị, bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha; ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.

< 以賽亞書 47 >