< 以賽亞書 38 >

1 那時希西家病得要死,亞摩斯的兒子先知以賽亞去見他,對他說:「耶和華如此說:你當留遺命與你的家,因為你必死不能活了。」
Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
2 希西家就轉臉朝牆,禱告耶和華說:
Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,
3 「耶和華啊,求你記念我在你面前怎樣存完全的心,按誠實行事,又做你眼中所看為善的。」希西家就痛哭了。
“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
4 耶和華的話臨到以賽亞說:
Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,
5 「你去告訴希西家說,耶和華-你祖大衛的上帝如此說:我聽見了你的禱告,看見了你的眼淚。我必加增你十五年的壽數;
“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.
6 並且我要救你和這城脫離亞述王的手,也要保護這城。
Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.
7 「我-耶和華必成就我所說的。我先給你一個兆頭,
“‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.
8 就是叫亞哈斯的日晷,向前進的日影往後退十度。」於是,前進的日影果然在日晷上往後退了十度。
Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.
9 猶大王希西家患病已經痊癒,就作詩說:
Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:
10 我說:正在我中年之日 必進入陰間的門; 我餘剩的年歲不得享受。 (Sheol h7585)
Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” (Sheol h7585)
11 我說:我必不得見耶和華, 就是在活人之地不見耶和華; 我與世上的居民不再見面。
Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.
12 我的住處被遷去離開我, 好像牧人的帳棚一樣; 我將性命捲起, 像織布的捲布一樣。 耶和華必將我從機頭剪斷, 從早到晚,他要使我完結。
Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
13 我使自己安靜直到天亮; 他像獅子折斷我一切的骨頭, 從早到晚,他要使我完結。
Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
14 我像燕子呢喃, 像白鶴鳴叫, 又像鴿子哀鳴; 我因仰觀,眼睛困倦。 耶和華啊,我受欺壓, 求你為我作保。
Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
15 我可說甚麼呢? 他應許我的,也給我成就了。 我因心裏的苦楚, 在一生的年日必悄悄而行。
Ma gịnị ka m ga-ekwu? Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a. M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile nʼihi ihe mwute nke obi m.
16 主啊,人得存活乃在乎此。 我靈存活也全在此。 所以求你使我痊癒,仍然存活。
Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ. Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha. I nyeghachila m ahụ ike, mee ka m dị ndụ.
17 看哪,我受大苦,本為使我得平安; 你因愛我的靈魂便救我脫離敗壞的坑, 因為你將我一切的罪扔在你的背後。
Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.
18 原來,陰間不能稱謝你, 死亡不能頌揚你; 下坑的人不能盼望你的誠實。 (Sheol h7585)
Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. (Sheol h7585)
19 只有活人,活人必稱謝你, 像我今日稱謝你一樣。 為父的,必使兒女知道你的誠實。
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
20 耶和華肯救我, 所以,我們要一生一世 在耶和華殿中 用絲弦的樂器唱我的詩歌。
Onyenwe anyị ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
21 以賽亞說:「當取一塊無花果餅來,貼在瘡上,王必痊癒。」
Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
22 希西家問說:「我能上耶和華的殿,有甚麼兆頭呢?」
Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”

< 以賽亞書 38 >