< 以賽亞書 3 >

1 主-萬軍之耶和華從耶路撒冷和猶大, 除掉眾人所倚靠的,所仗賴的, 就是所倚靠的糧,所仗賴的水;
Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
2 除掉勇士和戰士, 審判官和先知, 占卜的和長老,
Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
3 五十夫長和尊貴人, 謀士和有巧藝的, 以及妙行法術的。
na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.
4 主說:我必使孩童作他們的首領, 使嬰孩轄管他們。
“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”
5 百姓要彼此欺壓; 各人受鄰舍的欺壓。 少年人必侮慢老年人; 卑賤人必侮慢尊貴人。
Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
6 人在父家拉住弟兄,說: 你有衣服,可以作我們的官長。 這敗落的事歸在你手下吧!
Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
7 那時,他必揚聲說: 我不作醫治你們的人; 因我家中沒有糧食,也沒有衣服, 你們不可立我作百姓的官長。
Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
8 耶路撒冷敗落, 猶大傾倒; 因為他們的舌頭和行為與耶和華反對, 惹了他榮光的眼目。
Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
9 他們的面色證明自己的不正; 他們述說自己的罪惡,並不隱瞞, 好像所多瑪一樣。 他們有禍了!因為作惡自害。
Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
10 你們要論義人說:他必享福樂, 因為要吃自己行為所結的果子。
Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
11 惡人有禍了!他必遭災難! 因為要照自己手所行的受報應。
Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
12 至於我的百姓, 孩童欺壓他們, 婦女轄管他們。 我的百姓啊,引導你的使你走錯, 並毀壞你所行的道路。
Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
13 耶和華起來辯論, 站着審判眾民。
Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
14 耶和華必審問他民中的長老和首領,說: 吃盡葡萄園果子的就是你們; 向貧窮人所奪的都在你們家中。
Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
15 主-萬軍之耶和華說: 你們為何壓制我的百姓, 搓磨貧窮人的臉呢?
Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
16 耶和華又說: 因為錫安的女子狂傲, 行走挺項,賣弄眼目, 俏步徐行,腳下玎璫,
Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
17 所以,主必使錫安的女子頭長禿瘡; 耶和華又使她們赤露下體。
Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
18 到那日,主必除掉她們華美的腳釧、髮網、月牙圈、
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
19 耳環、手鐲、蒙臉的帕子、
ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
20 華冠、足鍊、華帶、香盒、符囊、
ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
21 戒指、鼻環、
ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile,
22 吉服、外套、雲肩、荷包、
ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
23 手鏡、細麻衣、裹頭巾、蒙身的帕子。
ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
24 必有臭爛代替馨香, 繩子代替腰帶, 光禿代替美髮, 麻衣繫腰代替華服, 烙傷代替美容。
Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
25 你的男丁必倒在刀下; 你的勇士必死在陣上。
Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
26 錫安的城門必悲傷、哀號; 她必荒涼坐在地上。
Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.

< 以賽亞書 3 >