< 以賽亞書 16 >

1 你們當將羊羔奉給那地掌權的, 從西拉往曠野,送到錫安城的山。
Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
2 摩押的居民在亞嫩渡口, 必像遊飛的鳥,如拆窩的雛。
Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
3 求你獻謀略,行公平, 使你的影子在午間如黑夜, 隱藏被趕散的人,不可顯露逃民。
Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
4 求你容我這被趕散的人和你同居。 至於摩押,求你作他的隱密處, 脫離滅命者的面。 勒索人的歸於無有, 毀滅的事止息了, 欺壓人的從國中除滅了,
Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
5 必有寶座因慈愛堅立; 必有一位誠誠實實坐在其上, 在大衛帳幕中施行審判, 尋求公平,速行公義。
A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.
6 我們聽說摩押人驕傲, 是極其驕傲; 聽說他狂妄、驕傲、忿怒; 他誇大的話是虛空的。
Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
7 因此,摩押人必為摩押哀號; 人人都要哀號。 你們摩押人要為吉珥‧哈列設的葡萄餅哀歎, 極其憂傷。
Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8 因為希實本的田地 和西比瑪的葡萄樹都衰殘了。 列國的君主折斷其上美好的枝子; 這枝子長到雅謝延到曠野, 嫩枝向外探出,直探過鹽海。
Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.
9 因此,我要為西比瑪的葡萄樹哀哭, 與雅謝人哀哭一樣。 希實本、以利亞利啊, 我要以眼淚澆灌你; 因為有交戰吶喊的聲音 臨到你夏天的果子, 並你收割的莊稼。
Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
10 從肥美的田中奪去了歡喜快樂; 在葡萄園裏必無歌唱,也無歡呼的聲音。 踹酒的在酒醡中不得踹出酒來; 我使他歡呼的聲音止息。
Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
11 因此,我心腹為摩押哀鳴如琴; 我心腸為吉珥‧哈列設也是如此。
Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
12 摩押人朝見的時候,在高處疲乏,又到他聖所祈禱,也不蒙應允。
Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.
13 這是耶和華從前論摩押的話。
Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,
14 但現在耶和華說:「三年之內,照雇工的年數,摩押的榮耀與他的群眾必被藐視,餘剩的人甚少無幾。」
ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

< 以賽亞書 16 >