< 創世記 36 >

1 以掃就是以東,他的後代記在下面。
Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.
2 以掃娶迦南的女子為妻,就是赫人以倫的女兒亞大和希未人祭便的孫女、亞拿的女兒阿何利巴瑪,
Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.
3 又娶了以實瑪利的女兒、尼拜約的妹子巴實抹。
Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.
4 亞大給以掃生了以利法;巴實抹生了流珥;
Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.
5 阿何利巴瑪生了耶烏施、雅蘭、可拉。這都是以掃的兒子,是在迦南地生的。
Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.
6 以掃帶着他的妻子、兒女,與家中一切的人口,並他的牛羊、牲畜,和一切貨財,就是他在迦南地所得的,往別處去,離了他兄弟雅各。
Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
7 因為二人的財物群畜甚多,寄居的地方容不下他們,所以不能同居。
Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
8 於是以掃住在西珥山裏;以掃就是以東。
Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
9 以掃是西珥山裏以東人的始祖,他的後代記在下面。
Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
10 以掃眾子的名字如下。以掃的妻子亞大生以利法;以掃的妻子巴實抹生流珥。
Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
11 以利法的兒子是提幔、阿抹、洗玻、迦坦、基納斯。
Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.
12 亭納是以掃兒子以利法的妾;她給以利法生了亞瑪力。這是以掃的妻子亞大的子孫。
Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
13 流珥的兒子是拿哈、謝拉、沙瑪、米撒。這是以掃妻子巴實抹的子孫。
Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
14 以掃的妻子阿何利巴瑪是祭便的孫女,亞拿的女兒;她給以掃生了耶烏施、雅蘭、可拉。
Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
15 以掃子孫中作族長的記在下面。以掃的長子以利法的子孫中,有提幔族長、阿抹族長、洗玻族長、基納斯族長、
Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
16 可拉族長、迦坦族長、亞瑪力族長。這是在以東地從以利法所出的族長,都是亞大的子孫。
Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
17 以掃的兒子流珥的子孫中,有拿哈族長、謝拉族長、沙瑪族長、米撒族長。這是在以東地從流珥所出的族長,都是以掃妻子巴實抹的子孫。
Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
18 以掃的妻子阿何利巴瑪的子孫中,有耶烏施族長、雅蘭族長、可拉族長。這是從以掃妻子,亞拿的女兒,阿何利巴瑪子孫中所出的族長。
Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
19 以上的族長都是以掃的子孫;以掃就是以東。
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
20 那地原有的居民-何利人西珥的子孫記在下面:就是羅坍、朔巴、祭便、亞拿、
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
21 底順、以察、底珊。這是從以東地的何利人西珥子孫中所出的族長。
Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
22 羅坍的兒子是何利、希幔;羅坍的妹子是亭納。
Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.
23 朔巴的兒子是亞勒文、瑪拿轄、以巴錄、示玻、阿南。
Ụmụ ndị ikom Shobal bụ, Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam.
24 祭便的兒子是亞雅、亞拿(當時在曠野放他父親祭便的驢,遇着溫泉的,就是這亞拿)。
Ụmụ ndị ikom Zibiọn mụrụ bụ Aịa na Ana. Ana bụ nwoke ahụ chọpụtara isi iyi mmiri ime ala ahụ nke mmiri dị ọkụ si nʼime ya na-asọpụta nʼọzara, mgbe ọ na-elekọta ịnyịnya ibu nna ya Zibiọn.
25 亞拿的兒子是底順;亞拿的女兒是阿何利巴瑪。
Ụmụ Ana bụ, Dishọn na Oholibama nwa nwanyị Ana.
26 底順的兒子是欣但、伊是班、益蘭、基蘭。
Ụmụ ndị ikom Dishọn bụ, Hemdan na Eshban na Itran na Keran.
27 以察的兒子是辟罕、撒番、亞干。
Ụmụ ndị ikom Eza bụ, Bilhan na Zaavan na Akan.
28 底珊的兒子是烏斯、亞蘭。
Ụmụ ndị ikom Dishan bụ, Uz na Aran.
29 從何利人所出的族長記在下面:就是羅坍族長、朔巴族長、祭便族長、亞拿族長、
Ndị a bụ ndị ọnụmara Hor, ọnụmara Lotan, ọnụmara Shobal, ọnụmara Zibiọn, ọnụmara Ana,
30 底順族長、以察族長、底珊族長。這是從何利人所出的族長,都在西珥地,按着宗族作族長。
ọnụmara Dishọn, ọnụmara Eza na ọnụmara Dishan. Ndị a niile bụ ndị ọnụmara Hor dịka nkewa ha si dị nʼala Sia.
31 以色列人未有君王治理以先,在以東地作王的記在下面。
Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze mbụ ha.
32 比珥的兒子比拉在以東作王,他的京城名叫亭哈巴。
Bela, nwa Beoa chịrị dịka eze nʼEdọm. Isi obodo ya bụ Dinhaba.
33 比拉死了,波斯拉人謝拉的兒子約巴接續他作王。
Mgbe Bela nwụrụ, Jobab nwa Zera onye Bozra nọchiri ya dịka eze.
34 約巴死了,提幔地的人戶珊接續他作王。
Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze.
35 戶珊死了,比達的兒子哈達接續他作王;這哈達就是在摩押地殺敗米甸人的,他的京城名叫亞未得。
Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị Midia nʼagha nʼala Moab nọchiri dịka eze. Isi obodo ya bụ Avit.
36 哈達死了,瑪士利加人桑拉接續他作王。
Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze.
37 桑拉死了,大河邊的利河伯人掃羅接續他作王。
Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze.
38 掃羅死了,亞革波的兒子巴勒‧哈南接續他作王。
Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
39 亞革波的兒子巴勒‧哈南死了,哈達接續他作王,他的京城名叫巴烏;他的妻子名叫米希她別,是米‧薩合的孫女,瑪特列的女兒。
Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
40 從以掃所出的族長,按着他們的宗族、住處、名字記在下面:就是亭納族長、亞勒瓦族長、耶帖族長、
Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
41 阿何利巴瑪族長、以拉族長、比嫩族長、
Oholibama, Elaa, Pinon,
42 基納斯族長、提幔族長、米比薩族長、
Kenaz, Teman, Mibza,
43 瑪基疊族長、以蘭族長。這是以東人在所得為業的地上,按着他們的住處。(所有的族長都是以東人的始祖以掃的後代。)
Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm, dịka ebe obibi ha na ala obi ha si dị. Nke a bụ ezinaụlọ Ịsọ bụkwa nna ndị Edọm.

< 創世記 36 >