< 創世記 10 >

1 挪亞的兒子閃、含、雅弗的後代記在下面。洪水以後,他們都生了兒子。
Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
2 雅弗的兒子是歌篾、瑪各、瑪代、雅完、土巴、米設、提拉。
Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras.
3 歌篾的兒子是亞實基拿、利法、陀迦瑪。
Ụmụ ndị ikom Goma bụ: Ashkenaz, Rifat na Togama.
4 雅完的兒子是以利沙、他施、基提、多單。
Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim na Rodanim.
5 這些人的後裔將各國的地土、海島分開居住,各隨各的方言、宗族立國。
(Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
6 含的兒子是古實、麥西、弗、迦南。
Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan.
7 古實的兒子是西巴、哈腓拉、撒弗他、拉瑪、撒弗提迦。拉瑪的兒子是示巴、底但。
Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan.
8 古實又生寧錄,他為世上英雄之首。
Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
9 他在耶和華面前是個英勇的獵戶,所以俗語說:「像寧錄在耶和華面前是個英勇的獵戶。」
Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
10 他國的起頭是巴別、以力、亞甲、甲尼,都在示拿地。
Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.
11 他從那地出來往亞述去,建造尼尼微、利河伯、迦拉,
Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
12 和尼尼微、迦拉中間的利鮮,這就是那大城。
na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
13 麥西生路低人、亞拿米人、利哈比人、拿弗土希人、
Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
14 帕斯魯細人、迦斯路希人、迦斐託人;從迦斐託出來的有非利士人。
ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto.
15 迦南生長子西頓,又生赫
Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het,
16 和耶布斯人、亞摩利人、革迦撒人、
ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
17 希未人、亞基人、西尼人、
ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
18 亞瓦底人、洗瑪利人、哈馬人,後來迦南的諸族分散了。
ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. Emesịa, ndị ikwu Kenan gbasara,
19 迦南的境界是從西頓向基拉耳的路上,直到迦薩,又向所多瑪、蛾摩拉、押瑪、洗扁的路上,直到拉沙。
oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
20 這就是含的後裔,各隨他們的宗族、方言,所住的地土、邦國。
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
21 雅弗的哥哥閃,是希伯子孫之祖,他也生了兒子。
A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
22 閃的兒子是以攔、亞述、亞法撒、路德、亞蘭。
Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram.
23 亞蘭的兒子是烏斯、戶勒、基帖、瑪施。
Ụmụ ndị ikom Aram bụ, Uz, Hul, Geta na Meshek.
24 亞法撒生沙拉;沙拉生希伯。
Apakshad bụ nna Shela, Shela bụrụ nna Eba.
25 希伯生了兩個兒子,一個名叫法勒,因為那時人就分地居住;法勒的兄弟名叫約坍。
Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa. Aha nwanne ya nwoke bụ Joktan.
26 約坍生亞摩答、沙列、哈薩瑪非、耶拉、
Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera,
27 哈多蘭、烏薩、德拉、
Hadoram, Ụzal, Dikla,
28 俄巴路、亞比瑪利、示巴、
Obal, Abimael, Sheba,
29 阿斐、哈腓拉、約巴,這都是約坍的兒子。
Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
30 他們所住的地方是從米沙直到西發東邊的山。
Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
31 這就是閃的子孫,各隨他們的宗族、方言,所住的地土、邦國。
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
32 這些都是挪亞三個兒子的宗族,各隨他們的支派立國。洪水以後,他們在地上分為邦國。
Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.

< 創世記 10 >