< 出埃及記 39 >

1 比撒列用藍色、紫色、朱紅色線做精緻的衣服,在聖所用以供職,又為亞倫做聖衣,是照耶和華所吩咐摩西的。
Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
2 他用金線和藍色、紫色、朱紅色線,並撚的細麻做以弗得;
Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ.
3 把金子錘成薄片,剪出線來,與藍色、紫色、朱紅色線,用巧匠的手工一同繡上。
Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
4 又為以弗得做兩條相連的肩帶,接連在以弗得的兩頭。
Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.
5 其上巧工織的帶子和以弗得一樣的做法,用以束上,與以弗得接連一塊,是用金線和藍色、紫色、朱紅色線,並撚的細麻做的,是照耶和華所吩咐摩西的。
Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
6 又琢出兩塊紅瑪瑙,鑲在金槽上,彷彿刻圖書,按着以色列兒子的名字雕刻;
Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.
7 將這兩塊寶石安在以弗得的兩條肩帶上,為以色列人做紀念石,是照耶和華所吩咐摩西的。
Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
8 他用巧匠的手工做胸牌,和以弗得一樣的做法,用金線與藍色、紫色、朱紅色線,並撚的細麻做的。
Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.
9 胸牌是四方的,疊為兩層;這兩層長一虎口,寬一虎口,
Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
10 上面鑲着寶石四行:第一行是紅寶石、紅璧璽、紅玉;
Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
11 第二行是綠寶石、藍寶石、金鋼石;
nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
12 第三行是紫瑪瑙、白瑪瑙、紫晶;
Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
13 第四行是水蒼玉、紅瑪瑙、碧玉。這都鑲在金槽中。
Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
14 這些寶石都是按着以色列十二個兒子的名字,彷彿刻圖書,刻十二個支派的名字。
Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
15 在胸牌上,用精金擰成如繩子的鍊子。
Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
16 又做兩個金槽和兩個金環,安在胸牌的兩頭。
Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
17 把那兩條擰成的金鍊子穿過胸牌兩頭的環子,
Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
18 又把鍊子的那兩頭接在兩槽上,安在以弗得前面肩帶上。
Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
19 做兩個金環,安在胸牌的兩頭,在以弗得裏面的邊上,
Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
20 又做兩個金環,安在以弗得前面兩條肩帶的下邊,挨近相接之處,在以弗得巧工織的帶子以上。
Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
21 用一條藍細帶子把胸牌的環子和以弗得的環子繫住,使胸牌貼在以弗得巧工織的帶子上,不可與以弗得離縫,是照耶和華所吩咐摩西的。
Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
22 他用織工做以弗得的外袍,顏色全是藍的。
Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
23 袍上留一領口,口的周圍織出領邊來,彷彿鎧甲的領口,免得破裂。
A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.
24 在袍子底邊上,用藍色、紫色、朱紅色線,並撚的細麻做石榴,
Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.
25 又用精金做鈴鐺,把鈴鐺釘在袍子周圍底邊上的石榴中間:
Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ.
26 一個鈴鐺一個石榴,一個鈴鐺一個石榴,在袍子周圍底邊上用以供職,是照耶和華所吩咐摩西的。
Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
27 他用織成的細麻布為亞倫和他的兒子做內袍,
Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa,
28 並用細麻布做冠冕和華美的裹頭巾,用撚的細麻布做褲子,
jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
29 又用藍色、紫色、朱紅色線,並撚的細麻,以繡花的手工做腰帶,是照耶和華所吩咐摩西的。
Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
30 他用精金做聖冠上的牌,在上面按刻圖書之法,刻着「歸耶和華為聖」。
Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
31 又用一條藍細帶子將牌繫在冠冕上,是照耶和華所吩咐摩西的。
Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
32 帳幕,就是會幕,一切的工就這樣做完了。凡耶和華所吩咐摩西的,以色列人都照樣做了。
Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
33 他們送到摩西那裏。帳幕和帳幕的一切器具,就是鉤子、板、閂、柱子、帶卯的座,
Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,
34 染紅公羊皮的蓋、海狗皮的頂蓋,和遮掩櫃的幔子,
na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi,
35 法櫃和櫃的槓並施恩座,
na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya,
36 桌子和桌子的一切器具並陳設餅,
na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
37 精金的燈臺和擺列的燈盞,與燈臺的一切器具,並點燈的油,
na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ,
38 金壇、膏油、馨香的香料、會幕的門簾,
na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute,
39 銅壇和壇上的銅網,壇的槓並壇的一切器具,洗濯盆和盆座,
na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya,
40 院子的帷子和柱子,並帶卯的座,院子的門簾、繩子、橛子,並帳幕和會幕中一切使用的器具,
akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ
41 精工做的禮服,和祭司亞倫並他兒子在聖所用以供祭司職分的聖衣。
na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.
42 這一切工作都是以色列人照耶和華所吩咐摩西做的。
Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
43 耶和華怎樣吩咐的,他們就怎樣做了。摩西看見一切的工都做成了,就給他們祝福。
Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.

< 出埃及記 39 >