< 傳道書 8 >

1 誰如智慧人呢? 誰知道事情的解釋呢? 人的智慧使他的臉發光, 並使他臉上的暴氣改變。
Onye dị ka onye amamihe? Onye maara nkọwa ihe? Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.
2 我勸你遵守王的命令;既指上帝起誓,理當如此。
Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
3 不要急躁離開王的面前,不要固執行惡,因為他凡事都隨自己的心意而行。
Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.
4 王的話本有權力,誰敢問他說「你做甚麼」呢?
Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?
5 凡遵守命令的,必不經歷禍患;智慧人的心能辨明時候和定理。
Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.
6 各樣事務成就都有時候和定理,因為人的苦難重壓在他身上。
Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.
7 他不知道將來的事,因為將來如何,誰能告訴他呢?
Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?
8 無人有權力掌管生命,將生命留住;也無人有權力掌管死期;這場爭戰,無人能免;邪惡也不能救那好行邪惡的人。
Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
9 這一切我都見過,也專心查考日光之下所做的一切事。有時這人管轄那人,令人受害。
Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.
10 我見惡人埋葬,歸入墳墓;又見行正直事的離開聖地,在城中被人忘記。這也是虛空。
Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.
11 因為斷定罪名不立刻施刑,所以世人滿心作惡。
Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.
12 罪人雖然作惡百次,倒享長久的年日;然而我準知道,敬畏上帝的,就是在他面前敬畏的人,終久必得福樂。
Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.
13 惡人卻不得福樂,也不得長久的年日;這年日好像影兒,因他不敬畏上帝。
Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.
14 世上有一件虛空的事,就是義人所遭遇的,反照惡人所行的;又有惡人所遭遇的,反照義人所行的。我說,這也是虛空。
Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.
15 我就稱讚快樂,原來人在日光之下,莫強如吃喝快樂;因為他在日光之下,上帝賜他一生的年日,要從勞碌中,時常享受所得的。
Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.
16 我專心求智慧,要看世上所做的事。(有晝夜不睡覺不合眼的。)
Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,
17 我就看明上帝一切的作為,知道人查不出日光之下所做的事;任憑他費多少力尋查,都查不出來,就是智慧人雖想知道,也是查不出來。
mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.

< 傳道書 8 >