< 申命記 19 >

1 「耶和華-你上帝將列國之民剪除的時候,耶和華-你上帝也將他們的地賜給你,你接着住他們的城邑並他們的房屋,
Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile,
2 就要在耶和華-你上帝所賜你為業的地上分定三座城。
mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
3 要將耶和華-你上帝使你承受為業的地分為三段;又要預備道路,使誤殺人的,都可以逃到那裏去。
Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.
4 「誤殺人的逃到那裏可以存活,定例乃是這樣:凡素無仇恨,無心殺了人的,
Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.
5 就如人與鄰舍同入樹林砍伐樹木,手拿斧子一砍,本想砍下樹木,不料,斧頭脫了把,飛落在鄰舍身上,以致於死,這人逃到那些城的一座城,就可以存活,
Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.
6 免得報血仇的,心中火熱追趕他,因路遠就追上,將他殺死;其實他不該死,因為他與被殺的素無仇恨。
Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.
7 所以我吩咐你說,要分定三座城。
Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.
8 耶和華-你上帝若照他向你列祖所起的誓擴張你的境界,將所應許賜你列祖的地全然給你,
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,
9 你若謹守遵行我今日所吩咐的這一切誡命,愛耶和華-你的上帝,常常遵行他的道,就要在這三座城之外,再添三座城,
nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.
10 免得無辜之人的血流在耶和華-你上帝所賜你為業的地上,流血的罪就歸於你。
Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
11 「若有人恨他的鄰舍,埋伏着起來擊殺他,以致於死,便逃到這些城的一座城,
Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,
12 本城的長老就要打發人去,從那裏帶出他來,交在報血仇的手中,將他治死。
ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya.
13 你眼不可顧惜他,卻要從以色列中除掉流無辜血的罪,使你可以得福。」
Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.
14 「在耶和華-你上帝所賜你承受為業之地,不可挪移你鄰舍的地界,那是先人所定的。」
Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.
15 「人無論犯甚麼罪,作甚麼惡,不可憑一個人的口作見證,總要憑兩三個人的口作見證才可定案。
Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.
16 若有凶惡的見證人起來,見證某人作惡,
Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
17 這兩個爭訟的人就要站在耶和華面前,和當時的祭司,並審判官面前,
a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
18 審判官要細細地查究,若見證人果然是作假見證的,以假見證陷害弟兄,
Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha,
19 你們就要待他如同他想要待的弟兄。這樣,就把那惡從你們中間除掉。
ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.
20 別人聽見都要害怕,就不敢在你們中間再行這樣的惡了。
Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ.
21 你眼不可顧惜,要以命償命,以眼還眼,以牙還牙,以手還手,以腳還腳。」
Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.

< 申命記 19 >