< 撒母耳記上 2 >

1 哈拿禱告說: 我的心因耶和華快樂; 我的角因耶和華高舉。 我的口向仇敵張開; 我因耶和華的救恩歡欣。
Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
2 只有耶和華為聖; 除他以外沒有可比的, 也沒有磐石像我們的上帝。
“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
3 人不要誇口說驕傲的話, 也不要出狂妄的言語; 因耶和華是大有智識的上帝, 人的行為被他衡量。
“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.
4 勇士的弓都已折斷; 跌倒的人以力量束腰。
“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
5 素來飽足的,反作用人求食; 飢餓的,再不飢餓。 不生育的,生了七個兒子; 多有兒女的,反倒衰微。
Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.
6 耶和華使人死,也使人活, 使人下陰間,也使人往上升。 (Sheol h7585)
“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. (Sheol h7585)
7 他使人貧窮,也使人富足, 使人卑微,也使人高貴。
Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
8 他從灰塵裏抬舉貧寒人, 從糞堆中提拔窮乏人, 使他們與王子同坐, 得着榮耀的座位。 地的柱子屬於耶和華; 他將世界立在其上。
Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
9 他必保護聖民的腳步, 使惡人在黑暗中寂然不動; 人都不能靠力量得勝。
Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
10 與耶和華爭競的,必被打碎; 耶和華必從天上以雷攻擊他, 必審判地極的人, 將力量賜與所立的王, 高舉受膏者的角。
Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
11 以利加拿往拉瑪回家去了。那孩子在祭司以利面前事奉耶和華。
Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
12 以利的兩個兒子是惡人,不認識耶和華。
Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.
13 這二祭司待百姓是這樣的規矩:凡有人獻祭,正煮肉的時候,祭司的僕人就來,手拿三齒的叉子,
Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.
14 將叉子往罐裏,或鼎裏,或釜裏,或鍋裏一插,插上來的肉,祭司都取了去。凡上到示羅的以色列人,他們都是這樣看待。
Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.
15 又在未燒脂油以前,祭司的僕人就來對獻祭的人說:「將肉給祭司,叫他烤吧。他不要煮過的,要生的。」
Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.”
16 獻祭的人若說:「必須先燒脂油,然後你可以隨意取肉。」僕人就說:「你立時給我,不然我便搶去。」
Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.”
17 如此,這二少年人的罪在耶和華面前甚重了,因為他們藐視耶和華的祭物。
Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.
18 那時,撒母耳還是孩子,穿着細麻布的以弗得,侍立在耶和華面前。
Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.
19 他母親每年為他做一件小外袍,同着丈夫上來獻年祭的時候帶來給他。
Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.
20 以利為以利加拿和他的妻祝福,說:「願耶和華由這婦人再賜你後裔,代替你從耶和華求來的孩子。」他們就回本鄉去了。
Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”
21 耶和華眷顧哈拿,她就懷孕生了三個兒子,兩個女兒。那孩子撒母耳在耶和華面前漸漸長大。
Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.
22 以利年甚老邁,聽見他兩個兒子待以色列眾人的事,又聽見他們與會幕門前伺候的婦人苟合,
Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute.
23 他就對他們說:「你們為何行這樣的事呢?我從這眾百姓聽見你們的惡行。
Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a?
24 我兒啊,不可這樣!我聽見你們的風聲不好,你們使耶和華的百姓犯了罪。
Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu.
25 人若得罪人,有士師審判他;人若得罪耶和華,誰能為他祈求呢?」然而他們還是不聽父親的話,因為耶和華想要殺他們。
Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi.
26 孩子撒母耳漸漸長大,耶和華與人越發喜愛他。
Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.
27 有神人來見以利,對他說:「耶和華如此說:『你祖父在埃及法老家作奴僕的時候,我不是向他們顯現嗎?
Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?
28 在以色列眾支派中,我不是揀選人作我的祭司,使他燒香,在我壇上獻祭,在我面前穿以弗得,又將以色列人所獻的火祭都賜給你父家嗎?
Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ.
29 我所吩咐獻在我居所的祭物,你們為何踐踏?尊重你的兒子過於尊重我,將我民以色列所獻美好的祭物肥己呢?』
Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.
30 因此,耶和華-以色列的上帝說:『我曾說,你和你父家必永遠行在我面前;現在我卻說,決不容你們這樣行。因為尊重我的,我必重看他;藐視我的,他必被輕視。
“Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu.
31 日子必到,我要折斷你的膀臂和你父家的膀臂,使你家中沒有一個老年人。
Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi.
32 在上帝使以色列人享福的時候,你必看見我居所的敗落。在你家中必永遠沒有一個老年人。
Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị.
33 我必不從我壇前滅盡你家中的人;那未滅的必使你眼目乾癟、心中憂傷。你家中所生的人都必死在中年。
Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.
34 你的兩個兒子何弗尼、非尼哈所遭遇的事可作你的證據:他們二人必一日同死。
“‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.
35 我要為自己立一個忠心的祭司;他必照我的心意而行。我要為他建立堅固的家;他必永遠行在我的受膏者面前。
Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile.
36 你家所剩下的人都必來叩拜他,求塊銀子,求個餅,說:求你賜我祭司的職分,好叫我得點餅吃。』」
Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.”’”

< 撒母耳記上 2 >