< 撒母耳記上 12 >

1 撒母耳對以色列眾人說:「你們向我所求的,我已應允了,為你們立了一個王;
Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze.
2 現在有這王在你們前面行。我已年老髮白,我的兒子都在你們這裏。我從幼年直到今日都在你們前面行。
Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.
3 我在這裏,你們要在耶和華和他的受膏者面前給我作見證。我奪過誰的牛,搶過誰的驢,欺負過誰,虐待過誰,從誰手裏受過賄賂因而眼瞎呢?若有,我必償還。」
Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
4 眾人說:「你未曾欺負我們,虐待我們,也未曾從誰手裏受過甚麼。」
Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.”
5 撒母耳對他們說:「你們在我手裏沒有找着甚麼,有耶和華和他的受膏者今日為證。」他們說:「願他為證。」
Samuel zara sị ha, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”
6 撒母耳對百姓說:「從前立摩西、亞倫,又領你們列祖出埃及地的是耶和華。
Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.
7 現在你們要站住,等我在耶和華面前對你們講論耶和華向你們和你們列祖所行一切公義的事。
Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu Onyenwe anyị ka m chetara unu ihe ọma niile Onyenwe anyị meere unu na nna nna unu ha.
8 從前雅各到了埃及,後來你們列祖呼求耶和華,耶和華就差遣摩西、亞倫領你們列祖出埃及,使他們在這地方居住。
“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.
9 他們卻忘記耶和華-他們的上帝,他就把他們付與夏瑣將軍西西拉的手裏,和非利士人並摩押王的手裏。於是這些人常來攻擊他們。
“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ.
10 他們就呼求耶和華說:『我們離棄耶和華,事奉巴力和亞斯她錄,是有罪了。現在求你救我們脫離仇敵的手,我們必事奉你。』
Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtalaOnyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’
11 耶和華就差遣耶路‧巴力、比但、耶弗他、撒母耳救你們脫離四圍仇敵的手,你們才安然居住。
Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.
12 你們見亞捫人的王拿轄來攻擊你們,就對我說:『我們定要一個王治理我們。』其實耶和華-你們的上帝是你們的王。
“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.
13 現在,你們所求所選的王在這裏。看哪,耶和華已經為你們立王了。
Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.
14 你們若敬畏耶和華,事奉他,聽從他的話,不違背他的命令,你們和治理你們的王也都順從耶和華-你們的上帝就好了。
Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.
15 倘若不聽從耶和華的話,違背他的命令,耶和華的手必攻擊你們,像從前攻擊你們列祖一樣。
Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.
16 現在你們要站住,看耶和華在你們眼前要行一件大事。
“Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.
17 這不是割麥子的時候嗎?我求告耶和華,他必打雷降雨,使你們又知道又看出,你們求立王的事是在耶和華面前犯大罪了。」
Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”
18 於是撒母耳求告耶和華,耶和華就在這日打雷降雨,眾民便甚懼怕耶和華和撒母耳。
Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.
19 眾民對撒母耳說:「求你為僕人們禱告耶和華-你的上帝,免得我們死亡;因為我們求立王的事正是罪上加罪了。」
Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”
20 撒母耳對百姓說:「不要懼怕!你們雖然行了這惡,卻不要偏離耶和華,只要盡心事奉他。
Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.
21 若偏離耶和華去順從那不能救人的虛神是無益的。
Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
22 耶和華既喜悅選你們作他的子民,就必因他的大名不撇棄你們。
Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.
23 至於我,斷不停止為你們禱告,以致得罪耶和華。我必以善道正路指教你們。
Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.
24 只要你們敬畏耶和華,誠誠實實地盡心事奉他,想念他向你們所行的事何等大。
Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.
25 你們若仍然作惡,你們和你們的王必一同滅亡。」
Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”

< 撒母耳記上 12 >