< 歷代志上 4 >

1 猶大的兒子是法勒斯、希斯崙、迦米、戶珥、朔巴。
Ndị ikwu Juda bụ Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
2 朔巴的兒子利亞雅生雅哈;雅哈生亞戶買和拉哈。這是瑣拉人的諸族。
Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
3 以坦之祖的兒子是耶斯列、伊施瑪、伊得巴;他們的妹子名叫哈悉勒玻尼。
Ndị a bụ ụmụ Etam: Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
4 基多之祖是毗努伊勒。戶沙之祖是以謝珥。這都是伯利恆之祖以法她的長子戶珥所生的。
Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
5 提哥亞之祖亞施戶有兩個妻子:一名希拉,一名拿拉。
Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
6 拿拉給亞施戶生亞戶撒、希弗、提米尼、哈轄斯他利。這都是拿拉的兒子。
Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
7 希拉的兒子是洗列、瑣轄、伊提南。
Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
8 哥斯生亞諾、瑣比巴,並哈崙兒子亞哈黑的諸族。
na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.
9 雅比斯比他眾弟兄更尊貴,他母親給他起名叫雅比斯,意思說:我生他甚是痛苦。
Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
10 雅比斯求告以色列的上帝說:「甚願你賜福與我,擴張我的境界,常與我同在,保佑我不遭患難,不受艱苦。」上帝就應允他所求的。
Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
11 書哈的弟兄基綠生米黑,米黑是伊施屯之祖。
Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
12 伊施屯生伯拉巴、巴西亞,並珥拿轄之祖提欣拿,這都是利迦人。
Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
13 基納斯的兒子是俄陀聶、西萊雅。俄陀聶的兒子是哈塔。
Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.
14 憫挪太生俄弗拉;西萊雅生革‧夏納欣人之祖約押。他們都是匠人。
Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
15 耶孚尼的兒子是迦勒;迦勒的兒子是以路、以拉、拿安。以拉的兒子是基納斯。
Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
16 耶哈利勒的兒子是西弗、西法、提利、亞撒列。
Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
17 以斯拉的兒子是益帖、米列、以弗、雅倫。米列娶法老女兒比提雅為妻,生米利暗、沙買,和以實提摩之祖益巴。米列又娶猶大女子為妻,生基多之祖雅列,梭哥之祖希伯,和撒挪亞之祖耶古鐵。
Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
19 荷第雅的妻是拿含的妹子,她所生的兒子是迦米人基伊拉和瑪迦人以實提摩之祖。
Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham, bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
20 示門的兒子是暗嫩、林拿、便‧哈南、提倫。 以示的兒子是梭黑與便‧梭黑。
Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon. Ishi mụrụ Zohet na Ben-Zohet.
21 猶大的兒子是示拉;示拉的兒子是利迦之祖珥,瑪利沙之祖拉大,和屬亞實比族織細麻布的各家。
Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
22 還有約敬、哥西巴人、約阿施、薩拉,就是在摩押地掌權的,又有雅叔比利恆。這都是古時所記載的。
na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie.
23 這些人都是窯匠,是尼他應和基低拉的居民;與王同處,為王做工。
Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.
24 西緬的兒子是尼母利、雅憫、雅立、謝拉、掃羅。
Simiọn mụrụ Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
25 掃羅的兒子是沙龍;沙龍的兒子是米比衫;米比衫的兒子是米施瑪;
Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
26 米施瑪的兒子是哈母利;哈母利的兒子是撒刻;撒刻的兒子是示每。
Ụmụ Mishma mụrụ bụ Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.
27 示每有十六個兒子,六個女兒,他弟兄的兒女不多,他們各家不如猶大族的人丁增多。
Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda.
28 西緬人住在別是巴、摩拉大、哈薩‧書亞、
Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual,
29 辟拉、以森、陀臘、
Bilha, Ezem, Tolad,
30 彼土利、何珥瑪、洗革拉、
Betuel, Homa, Ziklag,
31 伯‧瑪嘉博、哈薩‧蘇撒、伯‧比利、沙拉音,這些城邑直到大衛作王的時候都是屬西緬人的。
Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
32 他們的五個城邑是以坦、亞因、臨門、陀健、亞珊;
Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
33 還有屬城的鄉村,直到巴力。這是他們的住處,他們都有家譜。
tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
34 還有米所巴、雅米勒、亞瑪謝的兒子約沙、
Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,
35 約珥、約示比的兒子耶戶;約示比是西萊雅的兒子;西萊雅是亞薛的兒子。
Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
36 還有以利約乃、雅哥巴、約朔海、亞帥雅、亞底業、耶西篾、比拿雅、
nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
37 示非的兒子細撒。示非是亞龍的兒子;亞龍是耶大雅的兒子;耶大雅是申利的兒子;申利是示瑪雅的兒子。
na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
38 以上所記的人名都是作族長的,他們宗族的人數增多。
Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
39 他們往平原東邊基多口去,尋找牧放羊群的草場,
ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
40 尋得肥美的草場地,又寬闊又平靜。從前住那裏的是含族的人。
Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
41 以上錄名的人,在猶大王希西家年間,來攻擊含族人的帳棚和那裏所有的米烏尼人,將他們滅盡,就住在他們的地方,直到今日,因為那裏有草場可以牧放羊群。
Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
42 這西緬人中,有五百人上西珥山,率領他們的是以示的兒子毗拉提、尼利雅、利法雅,和烏薛,
Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha.
43 殺了逃脫剩下的亞瑪力人,就住在那裏直到今日。
Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.

< 歷代志上 4 >