< 阿摩司書 7 >

1 [神視一:蝗災]吾主上主叫我看見這事:割完君王的青草,當晚草初生時,蝗蟲出現了。
Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya.
2 當蝗蟲要吃光地上的青草時,我就說:「吾主上主,求你饒恕吧! 雅各伯還怎能存在﹖他已這樣弱小! 」
Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”
3 上主對這事後悔了。上主說:「這事不會發生。」[神視二:旱災]
Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
4 吾主上主叫我看見這事:看,吾主上主召來懲罰的火,燒毀了廣大的深淵,又燒毀了上主的基業。
Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
5 我就說:「吾主上主! 求你罷休! 雅各伯還怎能存在﹖他已這樣弱小! 」
Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”
6 上主對這事後悔了。吾主上主說:「這事也不會發生。」[神視三:鉛垂線]
Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
7 吾主上主叫我看見這事:看,有一個人立在牆上,手中拿著一條鉛垂線。
Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya.
8 上主對我說:「亞毛斯,你看見了什麼﹖」我答說:「一條鉛垂線。」吾主說:「看,我將鉛垂線安置在我民族以色列當中,我不再放過她。
Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
9 依撒格的高丘必要荒蕪,以色列的聖所必要廢棄;我必起來攻擊雅洛貝罕家。」
“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”
10 那時,貝特耳司祭阿瑪責雅派人向以色列王雅洛貝罕說:「亞毛斯在以色列家中圖謀背叛你,國家再不能容受他的一切言論,
Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
11 因為亞毛斯這樣說:雅洛貝罕必死於刀下,以色列必被據去充軍,遠離本土。」
Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’”
12 事後,阿瑪責雅又向亞毛斯說:「先見者,你走吧! 趕快到猶大國去,在那裏餬口,在那裏講預言。
Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.
13 在貝特耳不可講預言,因為這裏是君王的殿宇。」
Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”
14 亞毛斯回答阿瑪責雅說:「我原不是先知,也不是先知的弟子,只是一個放羊兼修剪野無花果的人。
Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.
15 但是,上主正在我趕羊時提了我來。上主對我說:你去向我的百姓以色列講預言吧!
Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
16 現在你且聽上主說什麼。你說:不要講預言攻擊以色列,不要發言反對依撒格家!
Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’
17 為此,上主這樣說:你的妻子必在城中賣淫,你的子女必喪生刀下,你的田地必被人以繩墨瓜分,你m在不潔之地,以色列必被據去充軍,遠離本土。」
“Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo. A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ, ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ. A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’”

< 阿摩司書 7 >